Victor Osimhen eturula ugo 'ọkachasị agba bọọlụ' n'asọmpi Serie A' nke Italy afọ 2023

Osimen na-ekele ọha maka nturuugo ya
Nkọwa foto, Victor Osimhen tiri goolu isii n'ime mgba bọọlụ iri ka ọ na-agbara ndị Napoli bọọlụ nagbanyeghị na o merụrụ ahụ n'oge bọọlụ ndị a
    • Onye dere ya, Isaiah Akinremi and Emmanuel Akindubuwa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Sports Africa
    • Ebeg o si, Lagos
  • Mgbe e biputara ya

Nwafọ Naịjirịa na-asụnye ọkpụ goolu bụ Victor Osimhen eturula ugo dịka ọkachasị agba bọọlụ nke afọ a nke otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mba Italy nyere ya n'ihi ike dị egwu ọ kpara na Napoli n'oge akụmbọọlụ gara aga.

Onyinye nkwanyeugwu ahụ bụ nke e chere n'ihu nwaamadị ahụ na-agbara otu egwu bọọlụ Super Eagles n'abalị Mọnde dịka o nyechaara otu egwu Napoli ọ na-agbara aka iji mabute iko mbụ ha kemgbe afọ 33.

Osimhen sụnyere ọkpụ goolu 26 n'asọmpi Serie A nke afọ 2022 banyere 2023, nke kachapụrụ kọwara akwụkwọ George Weah dịka nwafọ Afrịka kachasị nye goolu n'asọmpi mba Italy.

Onye a gbabuuru otu egwuregwu Lille na Wolfborg bọọlụ bụ nwafọ Afrịka mbụ ga-erite onyinye nkwanyeugwu AIC award dịka o sonyere ndị dịka Zlatan Ibrahimovic, Adrea Pirlo, Cristiano Ronaldo na onye nke natara onyinye ahụ n'afọ gara aga, Rafael Leao n'ịmabute onyinye nkwanyeugwu ahụ.

"Ụnụ emeela maka ịhụta m nakwa onyinye nkwanyeugwu ndị a, ana m ekele ndị ezinaụlọ m, ndị enyi na ndị nkwado m maka vootu ụnụ na nkwado ụnụ na-enweghị atụ,"

Osimhen, onye a gụnyekwara maka ịnata onyinye nkwanyeugwu otu egwu bọọlụ Serie A nke afọ a, kwuru nke a n'ozi ọ bipụtara n'akara X.

Osimhen bụ onye nwetara ihe mmerụahụ n'oge akụmbọọlụ a mana nwamadị a dị afọ 24 enyela goolu 6 n'asọmpi 10, dịka ọ lọghachiri n'otu egwu nke Walter Mazzari dịka onye e ji agbannwe mmadụ n'asọmpi ha meriri Atlanta n'ụbọchị 25 Nọvemba 2023.

Dịka ọ natara onyinye nkwanyeugwu AIC nke sochiri nkwanyeugwu Ballon d'Or nke ụmụnwoke afọ 2023 ebe ọ gbara onye nke asatọ, Osimhen na-asụnye ọkpụ goolu nwere olileanya ịbụ nwafọ Naịjirịa mbụ ga-eturuugo ọkacha agba bọọlụ n'Afrịka "Confederation of African Football (CAF)" nke ụmụnwoke n'afọ a kemgbe Kanu Nwankwo gbaara Arsenal bọọlụ ritechara ya n'afọ 1999.

Temwa Chawinga
Nkọwa foto, CAF leghaara Chawinga anya maka nkwanyeugwu nwaanyị kachasị agba bọọlụ n'Afrịka nke afọ a, dịka a na-agụnyeghi ya na ndị a họpụtara maka onyinye ahụ.

Etu osiladị, ọnụ ọchị ekweghị ụmụafọ mba Afrịka fụnyụọ ọkụ dịka nwafọ mba Malawi bụ Tabitha Chawinga mabutere onyinye nkwanyeugwu AIC maka ndị nwaanyị n'oge ọ gbachara onye nke mbụ n'ịsụnye ọkpụ goolu maka goolu 23 o nyeere otu egwu bọọlụ Inter Milan.

Nwaagbọghọ ahụ gbara afọ 27, bụ onye enyepụrụ n'efu n'otu egwu bọọlụ Paris St-Germain, bụ nwaanyị mbụ n'Afrịka kacha enye goolu n'asọmpi Serie A Femminile.

A na-ekwu na CAF leghaara Chawinga anya maka nkwanyeugwu nwaanyị kachasị agba bọọlụ n'Afrịka nke afọ a, dịka a na-agụnyeghi ya na ndị a họpụtara maka onyinye ahụ.

A ga-ama ndị ga-erite nturuugo a CAF na-ahazi n'ụbọchị Mọnde ụbọchị 11 nke ọnwa Disemba n'obodo Marrakesh mba Morocco.