Interpol wanted list: Lee ihe mere Interpol jị achọ ndị Naijirịa 16 a achọ

Mgbe e biputara ya

Ngalaba uweojii zuru ụwa ọnụ bụ International Crominal Police Organisation bụ Interpol edepụtala aha mmadụ iri na isii bụ ụmụ afọ Naijirịa a na-achọ achọ maka arụ ha kpara.

Dịka etu Interpol si arụ ọrụ ha, ha na mba ruru otu narị na iri itolu na ise na-arụ ọrụ iji hụ na nchekwa zuru ụwa ọnụ.

Dịka o siri dị ha bipụtara aha mmadụ puku asaa, otu narị na iri asaa na abụọ ndị a na-achọ achọ n'ụwa niile.

N'ime aha ndị a , mmadụ iri na isii bụ ụmụ afọ Naijirịa.

Ụfọdụ ndị Naijirịa Interpol na-achọ achọ

Ihe mmadụ 16 mere eji achọ ha ọnwụ na ndụ

EDOSOMWAN, JESSICA ESOHE
Nkọwa foto, EDOSOMWAN, JESSICA ESOHE

Mba na-achọ ya : Fransị

Aha nna ya: Edosomwan

Aha mbụ ya: Jessica Esohe

Ụbọchị ọmụmụ ya: 02/07/1993 (Ọ dị afọ 29)

Ebe a mụrụ ya: Bini, Naijirịa

Mba: Naijirịa

Ebubo mere eji achọ ya: Izopụ ego n'ụzọ ezịghị ezi, ịhazi usoro eji esopụ ego enwetara site na nrụrụaka.

EGBUE, BONIFACE UCHE
Nkọwa foto, EGBUE, BONIFACE UCHE

Mba na-achọ ya : Argentina

Aha nna ya: Egbue

Aha mbụ ya: Boniface Uche

Ụbọchị ọmụmụ ya: 07/03/1964 (Ọ dị afọ 58)

Ebe a mụrụ ya: Ahoada, Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : Spanish, English, Portuguese

Ebubo mere eji achọ ya: Iji ụzọ ahụghọ ebubata ibu na mba ọzọ.

UZOMA ENEH, JUDE
Nkọwa foto, UZOMA ENEH, JUDE

Mba na-achọ ya : Brazịl

Aha nna ya: Uzoma Eneh

Aha mbụ ya: Jude

Ụbọchị ọmụmụ ya: 11/08/1973 (Ọ dị afọ 49)

Ebe a mụrụ ya: Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : Spanish, English, Portuguese

Ebubo mere eji achọ ya: Ịgba mgbere ọgwụike site mba ruo mba

ASUQUO, MBUOTIDEM EDEM
Nkọwa foto, ASUQUO, MBUOTIDEM EDEM

Mba na-achọ ya : Gana

Aha nna ya: Asuquo

Aha mbụ ya: Mbuotidem Edem

Ụbọchị ọmụmụ ya: 30/03/1989 (Ọ dị afọ 33)

Ebe a mụrụ ya: Akparboyu, Krọs Riva Steeti, Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Izu ohi na ịwakpo nwaanyị n'ike

EZEKWEM, CHARLES CHINWEIKPE
Nkọwa foto, EZEKWEM, CHARLES CHINWEIKPE

Mba na-achọ ya : Equatorial Guinea

Aha nna ya: Ezekwem

Aha mbụ ya: Charlse Chinweikpe

Ụbọchị ọmụmụ ya: 27/09/1992 (Ọ dị afọ 29)

Ebe a mụrụ ya: Okponkume, Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Igbu ọchụ

Charlse Chinweikpe
Nkọwa foto, Charlse Chinweikpe

Mba na-achọ ya : Uruguay

Aha nna ya: Ezunara

Aha mbụ ya: Festus Chinedu

Ụbọchị ọmụmụ ya: 29/05/1985 (Ọ dị afọ 37)

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Igba mgbere ọgwụike (2) I sonye na otu ndị omekome

OKORO, BENEDICT
Nkọwa foto, OKORO, BENEDICT

Mba na-achọ ya : Nicaragua

Aha nna ya: Okoro

Aha mbụ ya: Benedict

Ụbọchị ọmụmụ ya: 01/05/1967 (Ọ dị afọ 55)

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English,Spanish, French

Ebubo mere eji achọ ya: Isonye n'otu ndị omekome

OBIDIOZOR, MALAHI IKECHUCWU
Nkọwa foto, OBIDIOZOR, MALAHI IKECHUCWU

Mba na-achọ ya : Angola

Aha nna ya: Obidiozor

Aha mbụ ya: Malahi, Ikechukwu

Ụbọchị ọmụmụ ya: 30/06/1979 (Ọ dị afọ 43)

Mba: Naịjirịa, Angola

Asụsụ ọ na-asụ : English, Portuguese

Ebubo mere eji achọ ya: ịtọrọ mmadụ, iji egbe ezu ohi na ịnwe egbe n'ụzọ ezịghị ezi

STANLEY, NWOKORIE ALCACHI
Nkọwa foto, STANLEY, NWOKORIE ALCACHI

Mba na-achọ ya : Angola

Aha nna ya: Stanley

Aha mbụ ya: Nwokorie, Alcachi

Ụbọchị ọmụmụ ya: 09/01/1972 (Ọ dị afọ 50)

Mba: Naịjirịa, Angola

Asụsụ ọ na-asụ : English, Portuguese

Ebubo mere eji achọ ya: ịtọrọ mmadụ, iji egbe ezu ohi na ịnwe egbe n'ụzọ ezịghị ezi

VITUS, AKACHI
Nkọwa foto, VITUS, AKACHI

Mba na-achọ ya : Angola

Aha nna ya: Vitus

Aha mbụ ya: Akachi

Ụbọchị ọmụmụ ya: 13/04/1984 (Ọ dị afọ 38)

Mba: Naịjirịa, Angola

Asụsụ ọ na-asụ : English, Portuguese

Ebubo mere eji achọ ya: ịtọrọ mmadụ, iji egbe ezu ohi na ịnwe egbe n'ụzọ ezịghị ezi

EZE, MARY
Nkọwa foto, EZE, MARY

Mba na-achọ ya : Denmark

Aha nna ya: Eze

Aha mbụ ya: Mary

Ụbọchị ọmụmụ ya: 01/04/1973 (Ọ dị afọ 49)

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Igba mgbere mmadụ

SALIF, BOUHARI
Nkọwa foto, SALIF, BOUHARI

Mba na-achọ ya : China

Aha nna ya: Salif

Aha mbụ ya: Bouhari

Ụbọchị ọmụmụ ya: 04/09/1971 (Ọ dị afọ 50)

Ebe a mụrụ ya : Zinder, Naịja Steeti

Mba: Naịjirịa, Nijee

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Igba mgbereọgwụike

NKEM, BUTCHANG TIMLOH
Nkọwa foto, NKEM, BUTCHANG TIMLOH

Mba na-achọ ya : Canada

Aha nna ya: Nkem

Aha mbụ ya: Butchang Timiloh

Ụbọchị ọmụmụ ya: 25/11/1988 (Ọ dị afọ 33)

Ebe a mụrụ ya : Libreville Gabon/Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Ịdịna mmadụ n'ike na erubeghị isi nkwekọrịta ụlọikpe nke kwuru na onye ahụ agaghị agba ọsọ na ihe ndị ọzọ

ADESINA, IFAKEMI
Nkọwa foto, ADESINA, IFAKEMI

Mba na-achọ ya : Brazil

Aha nna ya: Adesina

Aha mbụ ya: Ifakemi

Ụbọchị ọmụmụ ya: 30/05/1970 (Ọ dị afọ 52)

Ebe a mụrụ ya : Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Igba mgbere ọgwụike site na mba gaa na mba

COSTA, DA COSTA FRANKLE AUSTINE
Nkọwa foto, COSTA, DA COSTA FRANKLE AUSTINE

Mba na-achọ ya : India

Aha nna ya: Costa

Aha mbụ ya: Da Costa Frankle Austine

Ụbọchị ọmụmụ ya: ---/--/1963 (Ọ dị afọ 59)

Ebe a mụrụ ya : Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Njirimara ya: O nwere ihe mmerụ ahụ dị nsọ anya ya nke aka nri, ọ nwere ihe mmerụ ahụ na ntị nke aka nrị ya

Asụsụ ọ na-asụ : Niger-Kordofanian ( na ọzọ)

Ebubo mere eji achọ ya: Iji akwụkwọ adigboroja ma chọrọ iji ya mee ihe, ịrụpụta akwụkwọ adigboroja nke onye nwụrụ anwụ ji eke ihe ọ nwere, ịkpa nkata iji akwụkwọ adigboroja zuo ohi

OKROMI, FESTUS

Mba na-achọ ya : India

Aha nna ya: Okromi

Aha mbụ ya: Festus

Ụbọchị ọmụmụ ya: 26/06/1965 (Ọ dị afọ 57)

Ebe a mụrụ ya : Naijirịa

Mba: Naịjirịa

Njirimara ya: O nwere ihe mmerụ ahụ dị nsọ anya ya nke aka ekpe

Asụsụ ọ na-asụ : English

Ebubo mere eji achọ ya: Ikpa nkata izu ohi na nrụrụaka