Aga m eji ọkwa m dịka Imam na National Mosque wetere ndị Igbo ihe ọma - Iliyasu Usman Ogbonnaya Onah
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu, Kelechi Anozia na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist, Video Journalist na Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Ọkammụta Iliyasu Usman Ogbonnaya Onah, nwafọ Igbo ji ọkwa Imam n'ụlọ okpukperechi Alakụba 'National Mosque dị n'Abuja akọwaala etu njem ya n'okpukperechi ahụ si gaa ruo n'ogogo ọ nọ ugbua.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Ọkammụta Usman kwuru na a mụrụ ya n'ime okpukperechi Alakụba maka na nne na nna ya bụ ndị okpukperechi ahụ.
Ọ sị na a mụrụ ya n'obodo Ibeagwa-Aka dị n'okpuruọchịchị Igbo Eze South dị n'Enugwu Steetị bụ ebe ọ nọ malite ịgụ akwụkwọ banyere okpukperechi Alakụba.
Usman kwuru na ọ gụrụ akwụkwọ nwete ihe nzere Phd na Mahadum n'afọ 2011 na 2012, e mechaa chie ya ọkwa 'Ọkammụta' n'afọ 2021 na mahadum Nasarawa Steeti. O kwuru na mgbe ahụ na ọ malitere ide akwụkwọ ma na-agbasa ozi n'ọgbakọ dị iche iche ruo mgbe a hụrụ ya ma kwuo na o nwere ihe e ji etozuoke ịbụ onye ndu okpukperechi Alakụba.

Ebe foto si, Prof. Iliyasu Usman
Ọkammụta Usman kwuru na obi dị ya ụtọ n'ọkwa ahụ maka na ihe ọbụla na-eme na Naịjirịa ugbua na o so na-ahụ ya.
O kwuru na ọ ga-eji ohere ọkwa ahụ wetere ndị Igbo ihe ọma ma kwuo okwu megide ihe ọbụla ga-emegbu ndị Igbo na Naịjirịa. "Obi dị m ụtọ maka na ihe ọbụla na-eme na Naịjirịa ugbua anyị na-ahụ ya.
Chineke maara na ihe ọbụla ga-ewetere ndị Igbo udo, aga m agba mbọ n'ebe a ịhụ na e mere ya.
"Ihe ọbụla doro anya ga-abụ mmegbu nye ndị Igbo, Chineke ga-enyere m aka ka m gwaa ndị mụ na ha nọ ebe a na nke ahụ adịghị."
Ọkammụta Usman gara n'ihu kọwaa etu ụfọdụ ndị Igbo si ahụta okpukperechi Alakụba ma kwuo na ọ dịghị mma maka na okpukperechi ahụ abụghị naanị maka ndị ugwu.
O kwukwara ihe a ga-eme iji hụụ na ndị okpukperechi Alakụba na nke Kraịst bi n'udo na Naịjirịa. Kirie ihe o kwuru n'uju;

Ebe foto si, Prof. Iliyasu Usman



