Di m akwadoghi nkatọ a na-eme Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor - Uche Kanu

Nnamdi Kanu nakwa Ifeanyi Ejiofor na Mike Ozekhome
Mgbe e biputara ya

Ihe Nnamdi Kanu gwara m mgbe m gara zute ya n'aka ndi DSS – Uche Kanu

Uchechukwu Okwu Kanu na di ya bụ Nnamdi Kanu
Nkọwa foto, Uchechukwu Okwu Kanu na di ya bụ Nnamdi Kanu

Uchechukwu Okwu Kanu bụ nwunye Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ mwereonwe akpọrọ Ipob n'ịchafụ ekwuputala okwu gbasara nleta ọ gara hụ di ya.

Uchechukwu kwuputara nke a n'ozi ọ gbasara na soshal midia n'ụbọchị ise nke ọnwa Mee ebe o ziri ndị mmadụ ozi ọ sị na "di ya sị ya zie".

Nwunye Kanu kwuru na ọ bịara Naịjirịa ịhụ di ya n'ebe ọ nọ n'aka ndị uweojii pụrụiche a kpọrọ DSS nke mere ya mbụ ha na-ahụ onwe ha kemgbe afọ 2021 mgbe gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu na mba Kenya.

N'ozi ahụ ọ gbasara, ọ bitụrụ aka n'ụfọdụ ihe gụnyere ihe banyere ndị okaiwu nọchitere anya di ya n'ụlọikpe ebe ikpe ya ka na-aga ihu.

Ihe ọzọ okwu ya bitụrụ aka bụ okwu banyere ahụike di ya bụ onye ọ sị na-arịa ọrịa mkpụrụ obi.

Ihe o kwuru banyere ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu

N'ihe gbasara ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu, ọ sị na Kanu gwara ya na o nweghi ihe ọjọọ o bu n'uche n'ebe Mike Ozekhome nakwa Ifeanyi Ejiofor nọ.

Kama ọ sị na o nwere ndị aghụghọ na-agagharị akpalite esemokwu n'etiti Kanu na ndị ahụ bụbu ọkaiwu ya site n'ịjụ ime ihe Kanu gwara ha mee.

"Ndị ahụ nupuruisi n'okwu Nnamdi Kanu kwuru, ọ sị ha kwụsị ịkatọ ndị ọkaiwu ya mana ha egeghị ntị" ka ọ sị.

Okwu Kanu na onwe ya kwuru na ọ gara leta Mike Ozekhome ma kelee ya maka aka o nyeere di ya mgbe ọ ka bụ ọkaiwu ya.

"Ozekhome gbara mbọ dị ukwu n'ikpe di m nke ọtụtụ mmadụ amaghị

"Ozekhome tinyere onwe ya n'ọnọdụ oke nkatọ nakwa okwu ọjọọ n'ihi na o kwetara ịnọchị anya di m n'ụlọikpe" ka Okwu Kanu kwuru.

Ọ kwukwara hoo haa na di anaghị akwado nkatọ nakwa okwu ọjọọ a na-eme Ejiofor na Ozekhome.

"O nwere onye na-agaghari achọkọta ndị ilo ebe niile ma tụgharịa sị na ndị ahụ bụ ndị ilo Nnamdi Kanu.

Ọ dọkwara onye ahụ aka na ntị sị ya kwụsị ịme ihe ọ na-eme maọbụ ọ kpọpụta aha ya n'ọha mmadụ.

Ihe ndị isi ndị Igbo na-emere Kanu

Ụfọdụ ndị isi na ndị ọchịchị Igbo na-akwado Kanu site n'ịbịara ya ụlọikpe mgbe niile
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị isi na ndị ọchịchị Igbo na-akwado Kanu site n'ịbịara ya ụlọikpe mgbe niile

Okwu Kanu kelere ndị isi na ndị ọchịchị Igbo di icheiche maka mbọ ha na-agba ịhụ na agbahapụrụ di ya dịka ụlọikpe si kpebie.

Otu onye ọ kachasị kelee bụ Ifeanyi Ubah maka etu o si gbaa mbọ ịme ka ya bụ Okwu Kanu hụ di ya anya.

N'ozi ahụ ọ gbasara, ọ sị "a na m ekele gị Ifeanyi Ubah maka etu ị sị mee ngwa ngwa ma gbaa mbọ ka m hụ di m, ekelee m gị".

Maka ndị ọzọ na-agba mbọ ọ sị "ụfọdụ ndị ọchịchị Igbo ka njichi di m na-echekasị, ha niile na-agba mbọ iwelite mkparịtaụka gbasara okwu ya (Kanu), e kelere m ha niile"

Ọ sị kwa na ọtụtụ ndị ahụ achọghị ka akpọọ ha aha mana ọ kwụsịghị ha ịgba mbọ ịhụ na atọghapụrụ Kanu ebe e ji ya.