Etu 'seminarian' si daa, nwụọ ka ọ na-eme ejije 'Good Friday'

Otu nwokorobịa nọ ọzụzụ ụkọchukwu adaala ma nwụọ na mahadum Claratian University of Nigeria, dị na Nekede, Owere n'ụbọchị Fraide.
Suel Ambrose gbara afọ iri abụọ na ise na-eme agwa Peter (otu n'ime ụmụ azụ Karisti) n'ejije ahụhụ Kraisti tara, dara ada n'ogige mahadum ahụ, nwụọ.
E bugara ya n'ụlọọgwụ mahadum ebe ha galiri ike ha tupu e buga ya ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre' dị n'Owere, ebe e kwuru na ọ nwụọla.

Oge onyentaakụkọ anyị gara ebe ahụ n'ụtụtụ Satọde, ebe niile dara jụụ dịka o nweghị emume Easter a na-eme n'ogige ahụ.
Ụkọchukwu na-achịkọta ụlọakwụkwọ ahụ bụ Fada Chukwuemeka Iheme gwara onye ntaakụkọ anyị na ụlọakwụkwọ ahụ ga-akọwapụtara ọha ihe mere "ma ndị ọdị n'aka nye anyị ikike."
Mana ụmụakwụkwọ kwuru na Ambrose , onye nọ afọ mbụ ya na ngalaba 'Philosophy' dara oge ha na-eme ejije maka Ọnwụ Kraisti, nwụọ ozigbo.

Otu n'ime ha anyị achọghị ịkpọ aha ya sịrị, "Ọ na-eme agwa Peter ebe Peter bechapụrụ otu n'ime ndịagha ntị, Jesọs were tighachikwa ya ma gwa Peter ka o tinye mma ya n'ọbọ."
"Oge ndịagha malitere chụwa ndị ụmụazụ ọzọ ịchufu ha, o dara n'ala malite gbawa ọbara."
Anyị bugara ya n'ụlọọgwụ nke ụlọakwụkwọ anyị, ndị dọkịta nwara ike ha, mana ọ zaghị ha."
"Anyị burukwa ya gawa ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre' dị Owere, ebe ahụ ka ekwuru na ọ laala mmụọ."































