Insecurity in Southeast Nigeria: Ebe niile awakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Abia, Anambra, Ebonyi, Enugu na Imo steeti

Ndí uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Ndị ekperima awakpola ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Obowo Imo steeti ma gbuo mmadụ abụọ.

Ha merụkwara ndị uweojii atọ ọzọ ahụ na mwakpo ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu gwara BBC Igbo na ndị uweojii gbukwara otu n'ime ndị ahụ wakporo ụlọọrụ ahụ.

Amatabeghị ndị mere ihe a mana Ikeokwu kwuru na ha ga-ewepụta akwụkwọ ozi n'oge n'adịghị anya.

Ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii bụzi ihe na-eme kwa mgbe kwa mgbe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ọdị nso a.

Lee ụlọọrụ ndị uweojii a wakporola na South-East kamgbe ọnwa isii

Ụlọọrụ ndị uweojii agbara ọkụ

Ebe foto si, Police Ebonyi

Mwakpo ụlọọrụ uweojii Anambra

Dịka ndị uweojii n'Ebonyi steeti kwuru na ndị a na-eche na ha bụ otu Ipob wakporo ụlọorụ ha dị n'Ọnịcha Isu na Tọzde ụbọchị anọ nke ọnwa Jenuwarị afọ 2021.

Nke a abụghị mbụ ụdị a na-eme makana nsonso a, a wakpoola ọtụtụ ụloọrụ ndị uweojii na mpaghara Ọwụwanya Anyanwụ ma zuru egbe ha.

Aha onyonyo, Etu ogbugbu onye okada si bute ọgbaaghara n'Igboukwu, Ekwulobia, Oko

Akụkọ a na-egosi ụfọdụ ụloọrụ ndị uweojii a wakporo n'ime ọnwa isii na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Abia Steetị

Mapụ na-egosi ebe agbara ụlọ ndị uweojii ọkụ

Ebe o mere : Ebem Ohafia, Abia state

Mgbe o mere: Ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Eprelụ afọ 2020 (18th April, 2020)

Ihe o metụtara: Ụlọọrụ ndị uweojii nakwa ụlọ obibi nke DPO.

Onye kwuru: Nke a si n'ọnụ kọmshọna ndị uweojii n'Abia Steetị bụ Ene. Okon

Mapụ na-egosi ebe agbara ụlọ ndị uweojii ọkụ

Ebe O mere : Umuoba dị n'okpuruọchịchị Isiala Ngwa North nke Abia Steetị.

Mgbe o mere: Ụbọchị abụọ nke ọnwa Febụwarị, afọ 2021 (2nd February, 2021).

Ihe o metụtara: Otu onye uweojii nwụrụ ebe otu nwaanyị onye uweojii merụrụ ahụ, a gbara ụloọrụ ndị uweojii nakwa ụgbọala ha ji arụ ọrụ tinyere ụgbọala ndị ọzọ.

Onye kwuru: Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Abia Steetị bụ Geoffery Ogbonna.

Ụgbọala ndị uweojii agbara ọkụ

Ebe foto si, Police Ebonyi

Ebe o mere : Ụlọọrụ ochie ndị uweojii a kpọrọ 'Old Zone 6 Annex' d n'Ogbor Hill Aba nke Abia Steetị.

Mgbe o mere : N'ọnwa Oktoba, afọ 2020 n'oge ngagharịiwe EndSARS.

Ihe o metụtara: Ụlọ obibi ndị uweojii nke Zone 6 Annex Aba.

Onye kwuru: Kọmịshọna uweojii Abia Steeti bụ Janet Agbede

Ebonyi Steeti

Mapụ na-egosi ebe agbara ụlọ ndị uweojii ọkụ

Ebe o mere : Ụlọọrụ ndị uweojii a kpọrọ 'Central Police Station' dị n'Abakiliki nke Ebonyi Steeti.

Mgbe o mere: Ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Ọktoba, afọ 2020 (26th October, 2020).

Ihe o metụtara: Ụlọọrụ ndị uweojii, ụgbọala, ọgbatumtum nakwa Keke.

Onye kwuru : Kọmịshọna uweojii n'Ebonyi Steetị bụ Philip Maku.

Mapụ na-egosi ebe agbara ụlọ ndị uweojii ọkụ

Ebe o mere : Obodo Uburu, okpuruọchịchị Ohaozara dị n'Ebonyi steeti.

Mgbe ọ mere : Ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Ọktoba, afọ 2020 (22nd October, 2020).

Ihe o metụtara: A wakporo ụloọrụ ndị uweojii ma merụọ ọtụtụ ndị uweojii merụrụ ahụ.

Onye kwuru: Kọmịshọna uweojii n'Ebonyi Steetị bụ Philip Maku.

Ụgbọala ndị uweojii agbara ọkụ

Ebe o mere : Onueke dị n'okpuruọchịchị Ezza South nke Ebonyi Steeti.

Mgbe o mere : Ụbọchị asatọ nke ọnwa Jenụwarị, afọ 2021 (8th January, 2021).

Ihe o metụtara: Ndị uweojii atọ nwụrụ.

Onye kwuru: Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ebonyi Steeti bụ Loveth Oda.

Anambra Steetị

Mapụ na-egosi ebe agbara ụlọ ndị uweojii ọkụ

Ebe o mere: Igboukwu dị n'okpuruọchịchị Aguata nke Anambra Steeti.

Mgbe o mere: Ụbọchị iri na isii nke ọnwa Disemba, afọ 2020 (16th December, 2020).

Ihe o metụtara: Ndị uweojii atọ nwụrụ.

Ihe kpatara ya: Onye uweojii gbagburu otu onye ọgbatumtum.

Onye kwuru: Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Anambra Steeti bụ Haruna Mohammed.

Mapụ na-egosi ebe agbara ụlọ ndị uweojii ọkụ

Ebe o mere : Amichi, Osumenyi, Ezinifite na Ukpọ dịcha n'Anambra Steetị.

Mgbe o mere : Ụbọchị iri na isii nke ọnwa Disemba, afọ 2020 (16th December, 2020) na Maachị na Epreelu 2021

Ụdịrị ọdachi : Egburu DPO, CSP Akpan Joseph, na ASP Agu Micheal, Station Officer (SO) na PC Udegbunam Sunday Celestine. A gbara ụloọrụ ha ọkụ, gbaa ụgbọala iri abụọ ọkụ ma mebie ọtụtụ ihe.

Ihe kpatara ya: Ngagharịiwe EndSARS.

Onye kwuru: Kọmịshọna Uweojii n'Anambra bụ John Anang.

Imo Steetị

Mapụ na-egosi ebe agbara ụlọ ndị uweojii ọkụ

Ebe o mere: Egbu dị n'Owerri nakwa Owerre nkwọọjị dị n'okpuruọchịchị Nkwere, Imo Steeti.

Mgbe o mere: Ụbọchị itoolu nke ọnwa Sepụtemba, 2020 (9th September, 2020, Maachị na Epreelu 2021).

Ihe o metụtara: E gburu otu onye uweojii ma napụ ndị ọzọ egbe ha.

Ihe kpatara ya: Aka ọrụ ndị omekome

Onye kwuru: Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Ikeokwu Orlando.

Mapụ na-egosi ebe agbara ụlọ ndị uweojii ọkụ

Ebe o mere: Nworieubi nke dị n'okpuruọchịchị Mbaitolu nke Imo Steeti.

Mgbe o mere: Ụbọchi iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba, 2020 (21st October, 2020).

Ihe o metụtara: A gbara ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ.

Ihe kpatara ya: Ngagharịiwe EndSARS.

Onye kwuru: Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Ikeokwu Orlando.

Enugwu Steetị

Mapụ na-egosi ebe agbara ụlọ ndị uweojii ọkụ

Ebe o mere: Ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Emene, Amechi-Idodo, Uwani na Trans Ekulu nke Enugwu Steeti.

Mgbe o mere: Ụbọchi iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktoba, 2020 (21st October, 2020).

Ụdịrị ọdachi: A gbara ụlọọrụ ndị uweojii ise ọkụ.

Ihe kpatara ya: Ngagharịiwe EndSAR.

Onye kwuru: Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo Steeti ahụ bụ Ahmad Abdurrahman.

Mapụ na-egosi ebe agbara ụlọ ndị uweojii ọkụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Eastern Security Network: Amaghị m maka ha mana ihe emeziri nke ọma dị mma - John Okiyi