Enugu: Ihe gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi kpebiri maka mwakpo ụlọọrụ uweojii na-eme ebe ahụ n'Ọgọstụ 23

Ugwuanyi na ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Gọvanọ Enugu steeti bụ Ifeanyị Ugwuanyị adọọla aka na ntị ka ndị wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ogui nakwa Abakpa ma bukọrọ egbe ha, weghachi egbe ndị ahụ.

O kwekwara nkwa na ọ ga-eme ihe niile o nwereike iji chọpụta ihe kpatara ọgbaghara dapụtara n'Emene n'Ọgọstụ 23 ma gbochie ya ime ọzọ.

O kwuputara nke a na ngwụcha ọgbakọ gbata gbata ya na ndị isi nchekwa nwere na steeti ahụ.

Ugwuanyi gosiri mwute ya maka ndị tufuru ndụ ha n'ọgbaghara ahụ mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụlọọrụ gọọmenti ụnyahụ bụ Sepụtemba 1.

Ugwuanyị na ndị nchekwa

Ebe foto si, Louis Amoke

O kwuru na site na mpụtara ọgbakọ ya na ndị nchekwa mere, na ọ dị mkpa inyetu ndị na-eme nnyocha obere oge ka ha wee mechaa nnyocha ha na-eme.

Gọvanọ Ugwuanyi kwukwara na ọgbaghara nke Ọgọstu 23 nke weere ndụ ụfọdụ ndị nchekwa na ndị Enugu nakwa mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ogui nakwa Abakpa (Ọgọstụ 28 na 30) ebe e buuru ụfọdụ ngwaagha, na-enye ya nchekasị.

Ugwuanyi kanyere nzụkọ ya na ndị igwe na ndị ụkọchukwu nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ụbọchị Sepụtemba 3.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: