Imo state covid war: Etu ndị ụlọomeiwu 13 si bute coronavirus n’Imo Steeti

Ọfọ ụlọomeiwu

Ebe foto si, Twitter/Nass

    • Onye dere ya, Chioma Obianinwa
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo
  • Mgbe e biputara ya

Okammụta Maurice Iwu bụ onyeisi ọgbakọ ehibere maka ibuso covid 19 agha n'Imo steeti ekwuola na mmadụ iri atọ butere coronavirus n'ụlọomeiwu steeti ahụ edopụla onwe ha iche.

O kwuru na ndị butere ọrịa a gụnyere ụfọdụ ndị ụlọomeiwu nakwa ndị ọzọ na-arụ ebe ahụ.

Maurice Iwu kwuru na onyeisi ụlọomeiwu ahụ bụ onye ji echiche amamihe ya kwuo ka agbachie ebe ahụ ruo mgbe e hichara ya ọfụma ma gba ya ọgwụ na-egbu nje.

Gee ihe Iwu kwuru n'uju ebe a:

Aha onyonyo, Etu ndị omeiwu Imo steeti 13 si bute coronavirus- Maurice Iwu

Kedụ ka ha si bute ọrịa a?

Ọkammụta Maurice Iwu kwuru na o nwereike ịbụ site n'aka ndị bu nje a a kpọrọ "Super spreaders."

N'okwu ya, "Super spreaders" bụ ndị bu ọrịa ahụ ma ha amaghị na ha bu ya wee na-akpagharị.

O kwuru na ọ bụrụ na gị na ha nọkọta n'ime ebe na-enweghi mpio ikuku si abata, ha nwereike ibunye mmadụ abụọ maọbụ atọ ọrịa ahụ.

Kedụ ka e si chọpụta ha?

Iwu kwuru na ọ bụ otu onye n'ime ha kpesara otu na-ahụ maka imegide Covid-19 na steeti ahụ, na o nwere ka ahụ si eme ya. Nke a mere ka a sị ya ga nyocha ahụ ya maka Covid-19.

Mgbe ọ gara wee chọpụta na o bu nje Covid-19, Iwu kwuru na nwoke ahụ ji aka ya dopu onwe ya na bee ya ebe a malitere ịgwa ndị ya na ha nọkọtarala na nso nso ka ha ga mee nyocha.

A chọpụtara Covid-19 n'ahụ mmadụ iri na abụọ ọzọ mere nyocha ahụ nke meziri ha iri na atọ buterela ọrịa ahụ.

Iwu kwuru na a ga-emekwa nyocha iji chọpụta ndị ọzọ ha na ndị a nwere mmekọ.

O kwuru na etu ọ dị ugbua, onweghi onye ọbụla n'ime ha a chọpụtara nje n'ahụ ha ọhụrụ a, o jituru na njọ.

Etu coronavirus ji gbuo nwaanyị mụrụ ụmụejima n'Imo Steetị

Ụmụ ejima

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Idemmiri a achụpụla ndị mmadụ na be ha na steeti kariri anọ na Naịjirịa

Nwaanyị butere coronavirus n'Imo steeti anwụọla ka ọ mụchara ụmụ ejima ya.

Maurice Iwu bụ onyeisioche otu na-ahụ maka ibuagha megide coronavirus n'Imo Steeti gwara BBC Igbo nke a na mkparịtaụka ha nwere n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa Juun.

Iwu si na ya bụ ọnwụ wutere ha makana ha e nwechala aṅụrị na nwaanyị ahụ mụpụtara ụmụ ejima ya n'agbanyeghị na ọ bu nje Covid-19.

O kwuru na e nweekwala ọtụtụ mmadụ butere ọrịa Covid-19 na steeti ahụ gbakerela.

Ọ ga-akwara n'ihu kwuo na Imo steeti enyochala mmadụ ruru narị asatọ dịka nyocha ka na-aga n'ihu gbua.

Iwu kwuru na steeti ahụ ka na-agwa ndị mmadụ tụmadị ndị na-aga ahịa ka ha kpachapụ anya.

Ka ha na-eso ntuziaka niile otu World Health Organisation nyere gbasara mmadụ ichekwa onwe ya maka ibute nje Covid-19.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: