AMVCA 2020: Ndị meriri na ndị e meriri na'emume nke afọ

Stanley 'Funnybone' Chibunna
Nkọwa foto, Stanley 'Funnybone' Chibunna
Mgbe e biputara ya

Stanley Chibunna eritela nturuugo onye kacha akpa ọchị n'ejije Nollywood.

Chibunna onye e ji Funnybone mara ritere nturuugo a n'emume 'Africa Magic Viewers Choic Awards' nke afọ 2020.

N'okwu ya, Funnybone kwuru na ya na-echeta nne ya onye nke nwụrụ ọnwa olemole gara aga.

Living in Bondage

Living in Bondage eturula ugo dịka ejije kacha ibe ya mma na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka n'afọ 2019/2020.

Ya bụ ejije nwetara nturuugo a n'emume 'Africa Magic Viewers Choic Awards' e mere n'ụbọchị Satọde.

Ejije a bụ mmegharị ejije nke mbụ e ji malite Nollywood bụ nke a kpọkwara 'Living in Bondage'.

Onye haziri ejije nke a bụ Ramsey Noah.

Ndị ọzọ sokwa mee ya gụnyere Kenneth Okonkwo, Kanayo O. Kanayo, Bob Manuel Udokwu na ndị ọzọ.

Nne ritere ntuuruugo maka ejije kacha mma e ji asụsụ Igbo mee
Nkọwa foto, Nne ritere ntuuruugo maka ejije kacha mma e ji asụsụ Igbo mee

BBC Igbo kwụ chịm dịka a na-etunye ndị gbara mbọ na Nollywood ugwu kwesịrị ha.

N'ime ntuurugo 26 e wepụtara na AMVCA nke afọ a, naanị asaa ka ndị ọha mmadụ nwere ike ịtụrụ vootu.

Lee ka okwe si gbaa:

Ihe nkiri a kpọrọ 'Nne' nke Victor Iyke mepụtara, ritere nzere ejije kacha bụ nke e ji asụsụ Igbo mee
Nkọwa foto, Ihe nkiri a kpọrọ 'Nne' nke Victor Iyke mepụtara, ritere nzere ejije kacha bụ nke e ji asụsụ Igbo mee
  • Ejije Igbo kacha mma bụ nke a kpọrọ 'Nne' nke onye mere ya bụ Victor Iyke
  • Onye meriri onye kacha mara ka e si eme 'Make up' bụ Lilian Omoyele Paul
  • Onye meriri 'Best Costume Designer' ejije TV bụ Dimeji Ajibola
  • Ndị meriri 'Best Picture Editor' bụ Tosin Igho and Bryan Dike
  • Onye meriri 'Best Sound Editor' bụ Christina Aragon
  • Ụlọorụ meriri 'Best Lighting Designer' bụ Cardoso
  • Onye meriri 'Best Cinematographer' bụ John Demps
  • Ihe nkiri ritere nturuugo 'Best Documentary' bụ Beverly Naya
  • Nke ritere 'Best soundtrack in a series' bụ Larry Gaga
  • Mkpụmkpụ ejije kacha mma bụ nke a kpọrọ 'Thorn'. Onye mere ya bụ Bola Enigma Akanbi
  • Ejije mkpaọchị kachc mma bụ 'Truth', nke onye mere ya bụ Anis Halloway