Igbo Greetings: Uru ekele bara n'ala Igbo

Ekele ndị ichie
Mgbe e biputara ya

Ndị Igbo tụrụ ilu sị na, 'Ekele na-eme ka ihu saa' dịka ọ bụ ụzọ mmadụ ji egosipụta etu obi dị ya n'ebe onye ọzọ nọ.

N'omenala Igbo, ekele bụ ihe mbụ na-ebute ụzọ na mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ma bụrụkwa ụzọ e ji egosi nkwanye ugwu.

Ikele na ikwe ekele bụ ihe zuru ụwa niile ọnụ. Ma ndị isiọcha, ndị isiojii, ndị Awụsa, Yoruba na ndị Igbo na-ekele ekele.

Mana akụkọ a na-eleba anya n'ekele dịka omenala na njirimara ndị Igbo.

Ndị na-amakọ onwe ha

Kedụ etu ndị Igbo si ahụta ekele?

Ekele so n'otu n'ime omenala ndị Igbo gbapụtara ihe nke mere na onye Igbo ọbụla na-akpụ ekele n'ọnụ mgbe niile.

Ekele n'ala Igbo dịrị nwoke ma nwaanyị, nwata nakwa okenye mana ọ bụ nwata na-ebu ụzọ a tụpụ ekele.

Ihe mbụ a na-akụziri nwata n'ala Igbo bụ etu o si ekele ekele karịsịa ndị tọrọ ya atọ na nzaghachị okenye ga e kelekwa ya.

Ụdịrị na usoro ekele e nwere n'ala Igbo

Ikwe n'aka

N'ala Igbo, e nwere ụdị ekele dị iche iche, nwee oge e ji ekele ha, nakwa ihe nke ọbụla na-egosipụta.

Ụfọdụ n'ime ha gụnyere;

Ekele njirimara ndị Igbo -Nke a bụ ekele e ji mara ndị Igbo, ha ji enwe mmekọrịta karịsịa ma ha nọkọrọ ọnụ n'ime ọgbakọ dị iche iche.

I ji maa atụ bụ Chaa! Chaa!! Chaaa!!! Igbo kwenu! -Heee!

Mụọnụ - Heee! Zụọnụ - Heee! Rienu! - Heee! Kachaanụ - Heee!

Ekele oge ụbọchị - Ekele oge ụbọchị bụ ndị a na-ekele n'oge dị iche iche n'ụbọchị dịka n'ụtụtụ, n'ehihie nakwa n'abalị.

Iji maa atụ, "Ị bọọla chi?"; "Ị pụtala ụra?"; "Ụtụtụ ọma;" "Daalụ" Ehihe ọma, Ụhuruchi ọma, Ị batala ọrụ nke taa? Ka chi fo, Rahụ jụụ dgz.

Ndị nze na ọzọ

Ekele ọrụ - Nke a bụ ekele ndị a na-ekele mgbe mmadụ na-arụ ọrụ, e nwekwara ike iji ya a gba mmadụ ume nke gụnyere Jisie ike, Ndewoo, Daalụ dgz.

Ekele ọrụ na-adịkwa iche site mpaghara Igbo dị iche iche. Ndị mpaghara Enugwu na-ekwu , 'Dejee', ndị Bende n'Abịa steeti na-ekele, "Jọkwa", ebe ndị Ngwa na-ekele , "Maazị".

Aha onyonyo, Omu of Okpanam: Ị hụtụla Ezenwaanyị na-alụ nwaanyị ibe ya?

Ndị Abakaliki na-ekele, "Tọkwe ehụ" (well done), ebe ndị Afikpo na-ekele "Ị dị ike ọrụ," maọbụ "Ka."

Ekele njem - Ekele a bụ nke ndị Igbo na-atụpụrụ onye na-eme njem dịka "Ije ọma", "E jee a lọọ", "Ije awele", "ka ọ dị", "ka okporoụzọ rubere gị isi" dgz.

E nwekwara nke e ji a nabata onye si njem bata dịka "Ị lọtala?", "Nnọọ" dgz.

Ekele nkasi obi - Ọ bụ ekele ndị Igbo ji akasi onye nwere otu ọdachi maọbụ nke ọzọ obi n'ihe dakwasịrị ya dịka "Kara obi", "Diwe", "Ndo", "Gharawa" dgz.

Ekele ndị Igbo

Ekele nri - Nke gụnyere ekele a na-ekwe mgbe ndị Igbo na-eri nri maọbụ mgbe ha richara nri dịka; "Bịa rie nri", I meela, I sie, Daalụ na nri ụtọ a dgz.

Ndị Igbo nwekwara ụzọ dị iche iche ha ji egosipụta ekele na-abụghị site n'okwu ọnụ nke gụnyere Ikwekọrịta n'aka, Ife aka, ịkụkọta akupe ( ndị ichie), ibi ọma, itu mmadụ aha na ndị ọzọ.

A bịa n'ime usoro ekele niile ndị a, ihe kachasị mkpa bụ iji nghọta, nsọpụrụ nakwa obi ọcha e ji kele ha.

N'ihi na ọ bụ nke a ga-akọwa ebumnobi onye mmadụ nwere n'ebe ibe ya nọ n'agbayeghi mgbe ụfọdụ "ụtọ abụghị n'ọchị eze".

Akụkọ dị ga-amsị gị: