Anambra steeti: 'Anyị asịghị na ajọ mmụọ nọ n'ụlọ gọọmenti Anambra steeti'

Willie Obiano

Ebe foto si, James Eze Facebook

Mgbe e biputara ya

Gọọmentị Anambra ekwuola na onweghị ajọ mmụọ nọ n'ime ụlọ gọọmenti steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuchitere gọvanọ Willie Obiano bụ James Eze kwuru na akụkọ a na-efegharị abụghị eziokwu maọlị ma kwukwa na ọ bụ iduhie ndị mmadụ.

Ezeh kwuru na gọvanọ Obiano esighị ya bụ ebe emume ekpere n'imi ma ya fọrọ ịtụ ụkwụ ebe ahụ.

O kwuru na onye wepụtara akụkọ ahụ tụgharịrị ihe ụkọchukwu Prosper Amah nke Ogbaru Diocese ụka Anglican kwuru gbasara ọkụ tanka gbara n'Onitsha mgbe ọ na-ekpere Naịjirịa nakwa Anambra steeti ekpere.

N'okwu ya, " Ụkọchukwu Amah kwuru okwu a n'emume ekpere 'Annual Prayer Rally of Anambra State' nke gbadoro ụkwụ n'ọkụ gbara na nso nso n'isi ajọ mmụọ na ajọ mmadụ juru n'obodo.

Aha onyonyo, Onitsha fire: "Ụlọ m na 'shọp' m gbara ọkụ, ebe ka m ga-agbaje?

Ezeh kwuru na odeakwụkwọ gọọmenti Anambra steeti bụ ọkammụta Solo Chukwulobelu nọ n'ọgbakọ ahụ rịọrọ ka ndị mmadụ kpe ekpere megide ndị na-eche echiche ọjọ megide Anambra steeti.

Cheta na akụkọ pụtara ụnyaahụ bụ ụbọchi abụọ nke ọnwa Nọvemba na-ekwu na gọọmenti Anambra kwuru na ajọ mmụọ juru na ime ụlọ gọọmenti steeti ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị

Aha onyonyo, Solomon Ukoha onye nrụputa akụrụmgwa