Komla Dumor Award 2019: Onye Uganda amaburula ya bụ nturugo

Solomon Serwanjja
Nkọwa foto, Solomon Serwanjja bụ onye nke ise irite nturuugo a.
Mgbe e biputara ya

Onye ntaakụkọ Yuganda bụ Solomon Serwanjja eritela nturugo Komla Dumor 2019 nke BBC hibere.

Serwanjja bụ onye ntaakụkọ n'ụlọọrụ mgbasa ozi akpọrọ 'NBS TV' ebe o na-eme otu ihe ngosi na-ewu ewu.

Aha onyonyo, Waihiga Mwaura ritere BBC World News Komla Dumor award nke 2018

O mepụtala akụkọ dị icheiche nwetere ihe nrite ma nke o mepụtara ngalaba akpọrọ 'BBC Africa eye' gbasara ire ọgwụ gọọmenti wepụtara ka-ejiri gwọ ndị mmadụ na nkịtị.

Nturugo a malitere kamgbe afọ 2014, iji wee kwanyere onye ntaakụkọ BBC bụ Komla Dumor nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri anọ na atọ, n'afọ 2014.

Serwanjja bụ onye nke ise na-erite ya bụ nturugo dịka Waihiga Mwaura, Amina Yuguda, Didi Akinyelure nakwa onye Yuganda Nancy Kacungira ibe ya ritegoro ya.

Aha onyonyo, Dịka a na-amalite nturuugo Komla Dumor nke afọ a, ndị otu ya n'ụlọọrụ na-echeta ọrụ ya

Nturugo a gunyere ya ị ga-anọdụ n'isi ụlọrụ BBC dị na mba UK , ma mecha gaa Yuganda gaa mee akụkọ ga-ewu ewu.

Serwanja gbara mbọ me ka ndị ọkaikpe na-enyocha ndị na-azọ nturugo a ghọta atụghị ụjọ n'iwepụta akụkọ ọbụla bụ nke ga-enye ọha aka.

Onyeisi 'BBC World Service Group' bụ Jamie Angus kwuru na ntụrụgo a bụ nke eji akwanyere Komla ugwu dị BBC ezigbo mkpa.

Ihe nkiri a ga-amasị gị

Aha onyonyo, Igbo Language: Gịnị bụ 'Comb' n'asụsụ Igbo?

Akụkọ ndị ga-amasị gị