Herdsmen crisis: Gọọmenti Enugu state amalitela ikpochasị ọhịa na steeti ahụ
Mgbe e biputara ya
Gọọmenti Enugwu steeti ekwuola na ihe mere ha ji asụ oke ọhịa dịcha na steeti ahụ bụ "iji gbaa n'anwụ ebe ndị ntọ na ndị ohi na-ezo".
Iji mejuputa nkwa gọọmenti Enugwu kwere banyere nchekwa ndụ na steeti ahụ, ha amalitela ikpocha nnukwu ọhịa dị n'Ihe, Four Corner Ozalla-Udi road wee rue n'Obiagu, Udi.

Ya bụ atụmatụ bụ nke ha kwuru na ọ ga-enye aka hụ na ndị ntọrị, ndị ohi na ndị ogbu mmadụ enweghịzị ebe ha ga-ezo ọzọ.

Mgbe BBC rutere n'ọhịa Four Corner, Akagbe Ugwu nakwa isi Ozalla, ndị ọrụ ha bụ igbutu osisi na-aru ọrụ ha n'ike n'ike.
Lee ihe BBC hụrụ ebe ahụ:



Akụkọ ga-amasị gị:


























