Sexual assault: Ndị omekome kwasoro nwaagbọghọ iko ma gbuo ya

Juliet Eze
Nkọwa foto, Juliet Eze Nne nwaagboghọ ahụ egburu
Mgbe e biputara ya

Iru uju na ibe akwa jupụtara n'ezinaụlọ Ngozi Eze, bụ onye ahụrụ ozu ya n'akụkụ ụlọakwụkwọ Community Sekọndịrị Imufu n'Enugwu Ezike ebe ọ gara ịmụ akwụkwọ ule Jamb.

Nne nwabọghọ ahụ Juliet Eze, kwuru na obi agbawaala ya n'ihi na o doro ya anya na nwa ya gabigara ihe oke ihe ụfụ n'aka ụmụokroọbiịa ahụ tupu ha e gbuo ya.

O kwuru na ọnwụ nwa ya dịka ọ bụ ya na nrọ.

Dịka nna nwata a egburu bụ Jonathan Eze gwara BBC, na nwa ya nwaanyị si Abuja ebe ya na nne ya bi lọta.

O kwuru na ọ na-ebu ya n'ụgbọ ọgbatutum aga ebe ọ na-akwado maka ule Jamb.

Jonathan
Nkọwa foto, Jonathan Eze Nna Ngozi

Eze ji anya mmiri kwuo na ọdachị a mere na mbido izu ụka a mgbe ọ gara ibulata nwa ka o mechara ọmụmụihe na mgbede mana ọhụghị ya.

O kwuru na ọ malitere chọwa nwa ya rue ime abalị tupu ọ gwa ndị ụmụnna ya na igwe obodo na nwa ya na-efu efu.

Ọ bụ n'ụtụtụ ụbọchị Wenezde ka ndị mmadụ hụrụ ozu nwa ya n'akụkụ ụlọakwụkwọ dị n'Imufu ebe ahụ.

Osote onyeisi ụlọakwụkwọ Community Sekọndịrị Imufu, bụ Benedict Eke kwuru na ọ bụghị n'ụlọ akwụkwọ ka egburu nwaagbọ, kama na ahụrụ ozu ya n'akụkụ ụlọakwụkwọ ahụ.

Enugu Ezike
Nkọwa foto, Ahụrụ ozu Ngozi na akụkụ ụlọakwụkwọ a

Igwe ndị Imufu bụ Igwe Remigus Attah kwuru na ịma nwaanyị elu n'ike ma gbuo ya bụ ụdị arụ na-emebeghi mbụ n'ala ha ma kwuo na ọ bụ ihe ịgbagwoju anya na mmadụ katara obị kpaa ụdị arụ a.

Onye isi ndị nche n'Imufu bụ Augustine Okechukwu nakwa ndị ọnụ na-eru n'okwu kwere nkwa na oge na-adịghị anya na aka ga-akpara ndị gburu Ngozi Charity Eze n'ihi na ha agbala ọnya ka anwụdo ha.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: