Abia state: Anyị akwapịaghị ụlọ oriri ndị ahụ maka akwụnakwụna

Ebe foto si, NurPhoto
Mgbe e biputara ya
Gọọmentị Abia steeti akọwarala BBC Igbo ihe mere ha jiri gbachie ụfọdụ ụlọ oriro n'Aba.
Okaiwu Ikpeazu gwara BBC Igbo na ọ bụghị maka ụmụnwaanyị na-agba akwụnwa ebe ahụ butere mgbachi ahụ.
Ha kọwara na ọ bụ maka na ebe ahụ aghọrọla ụlọ ebe ndị ohi na-ezukọ onwe ha ma na-akpa mkpamkpa.

Ebe foto si, Getty Images
N'ọnụ ya "nchekwa ndụ na akaụnaụba ndị mmadụ bụ ihe dị gọmentị Abia steeti mkpa."
O kwukwara na o teela aka ha na-anụ akụkọ gbasara mwakpo ụmụnwaanyị na mwakpo ndị mmadụ na-agafe n'akụkụ ebe ahụ.
Ugbua a na-akwado ịkwapịa ụfọdụ ụlọ ndị ebe Ikpeazu kwuru na "a ga-etinye osisi ọkụ latrịk n'okproụzọ ebe ahụ'.


























