Lassa Fever outbreak: Lekwa mkpamkpa Iba Lasa na-akpa n'Umuahịa nakwa ihe iri imaghị maka ọrịa a

Rat
Nkọwa foto, Oke bụ anụmanụ n'ebu ọria lassa
Mgbe e biputara ya

Ndị Abia ụjọ atụla ụnụ makana ministri na-ahụ maka ahụike na-egbochi ọrịa Iba bataralanụ na steeti ahụ ifesasi karịa etu ọ dị ugbua.

Ọ bụ dọkịta Joe Osuji bụ kọmishọna ahụike Abia steeti na-agwa ndị Abia nke a.

Osuji kwuru na ya ndị otu ya achọputala otu onye ọrịa ahụ ji ugbua ma na-enye ya ọgwụgwụ.

Ọ kwuru na otu gbata gbata anọrọla chịm ruo ụbọchị iri abụọ n'otu izaa ndị mmadụ nwere ike idanyere ọrịa ahụ.

Ọ rịọla ka ndị Abia chụpụ oke , kwụọ aka mgbe niile, dowe gburugburu ha ọcha, kwụsị ịṅụ "garri", sie nri ha n'ọkụ ọfụma tupu ha erie.

O kwukwara ka ha gaa n'ụlọ ọgwụ nọ ha nso ma ya bụ ọrịa banye n'ahụ ha.

Lassa Fever: Ihe iri ị maghị maka ọrịa ọjọọ a

Ọkacharamara n'okwu ahụike ọha bụ Dr Chuks Agunwa nke UNTH kọwara na ịba Lasa na-egbu mmadụ ma onweghị nleta n'oge.

Dokita ahụike ọha bụ Dr Agunwa akọwala na isi jọrọ ọrịa Lasa njo nke ukwu.

" Ọ na-egbu mmadụ rinne ọ banye gị n'ahụ ọ na-enye nnukwu nsogbu. Ọ na-ahịa ahụ ịgwọta mana "

Mana, "onye nwere lasa gaa n'ụlọọgwu n'oge, a ga agwọtali ya."

Ụzọ esi enweta ya

Dọkịta Agunwa kọwara na ọ dị ụzọ abụọ e si ebutekarị ịba Lasa:

  • Ịgbasa ọka, gari na ngwa nri n'okporoụzọ ebe oke ọhịa nwere ike nyụnye ya mamịrị maọbụ nsị
  • Site mmiri, ọsịsọ, ọbara, mamiri, nsị, agbọọ na mmiri ahụ onye nwere ọrịa lasa

Kedụ ka ị ga-esi ma na inwere ọrịa lasa?

Ihe ọrịrị
Nkọwa foto, Otu ụzọ esi gbochi ọrịa Lassa bu n'ikpuchite ihe mmadụ na-eri eri.

Ọ naghị ewe anya ị mata onye nwere ọrịa Lasa n'ihi na njirimara ya na-eyi nke ịba ndị ọzọ dịka taifod, ịba wdgz.

Mana Agunwa dụrụ ọdụ ka ị gaa ụlọọgwụ maka nyocha ahụ ma ị hụ ihe ndị na-atụ aka na ị nwere ọrịa a dịka:

3 Mmadụ ịsị na oke arụ na-eme ya ( temperature karịa 38 degrees)

4. O na-eji isiọwụwa ebido

5. Onye ahụ na-agbọ agbọ

6. Ọbara si na mamiri, nsị nakwa na anya onye ahụ na-apụta (nke a na-egosi na ọrịa ahụ akarịala otu izuụka, na ọrịa ahụ eriela ahụ onye ahụ)

Lasa na Ebola enwere nyiri?

Ndị ọrụ ahụike
Nkọwa foto, Mbaụwa toro Naịjirịa maka etu o siri hazie ọnọdụ oge Ebola batara

Lasa na Ebola nọ n'otu ezinaụlọ, ha abụọ bụ 'vịrọs'

7.Etu ha si egbu mmadụ yiri

8.Mana Ebola ka Lasa njo

Kedụ ihe i kwesiri ime?

10. Gaa ụlọọgwụ ozigbo i nwere njirimara a gụpụtara na 3,4,5 maọbụ 6.

Akụkọ ndị ga-amasị gị