NASS: Ihe mere ndị uweojii jiri kpọchie ihu ụlọomeiwu Abuja

Mgbe e biputara ya
Ndị uweojii gbochiri ụlọomeiwu, jụ na ndị ọrụ na ndị ntaakụkọ agaghị abata ebe ahụ ụbọchị Tuzde, Disemba 18, 2018.
Onye ntaakụkọ BBC nọ n'ụlọomeiwu n'Abuja ka ọ na-eme bụ Yusuf Tijani, kwuru na ndị uweojii kọwara na nke a bụ iji chekwa ndị na-abata n'ọgbọ ụlọomeiwu.
Ndị uweojii kwuru na e nyere ha iwu ichekwa akụkọ kwuru na

Cheta na ndị ọrụ ụlọomeiwu bidoro abụbọọrụ ụnyaahụ bụ Monde, dịka ha na-eti mkpu ka a kwụọ ha pasentị 28 na mbugo ụgwọ ọnwa e ji ha kemgbe afọ 2010.
Dịka ha nọ na-eme abụbọọrụ, ụfọdụ ha bịara ọrụ iji nyopụta ma ndị ogbo ha abịara.
Mana dịka ndị ọrụ ụlọomeiwu na-eme ngagharịiwe maka ụgwọ e ji ha, ndị ụlọomeiwu ukwu na ndị nta nwere ọgbakọ ha.

Mana dịka Tijani siri kwuo, ọtụtụ n'ime ndị omeiwu abịaghị ọgbakọ ha.

























