Minimum Wage: Buhari ga-eleba anya n'ịkwụ N30,000

Buhari na ndị Ọrụ na-eme ngagharị iwe
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọomentị Naịjirịa ekwuola na ha ga-elebanye anya n'ihe gbasara N30,000 bụ ego NLC chọrọ dịka ụgwọ ọnwa opekatampe.

Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuputere nke a na nzukọ ya na otu akpọrọ "tripartrite committee" n'asụsụ Bekee nwere n'Abuja taa bụ Nọvemba 6, 2018.

Buhari kwuru na ọ ga-ezigara Ụlọomeiwu Naịjirịa akwụkwọ gbasara mkpebi a.

Ọnụ na-ekwuchitere ya n'ihe gbasara mgbasa ozi ọgbara ọhụrụ bụ Bashir Ahmed, tinyere ihe nkiri si na nzukọ ha n'elu Twitter ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'aka ọzọ, ọnụ na-ekwuchitere ya n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu, zipuru ozi ihe Buhari kwuru na nzukọ a.

Gụọ ha ebe a:

N'akụkọ ọzọ,

Ndị ụlọomeiwu ukwu enyela ngalaba ha na-ahụ maka ndị uweojii, iwu ka ha mee nyocha gbasara mwakpo a wakporo ụlọ osote onyeisi ha bụ Ike Ekweremadu.

Ekweremadu na osote onyeisi ndị uweojii Joshak Habila
Nkọwa foto, Osote onyeisi ndị uweojii Joshak Habila agala ịhụ Ekweremadu

Cheta na a nwụchiri otu nwoke bu egbe banye n'ime ọnụụlọ Ekweremadu, n'ụtụtụ ụbọchị Nọvemba 6, 2018.

Abụbọ-ọrụ ASUU

Ọkammụta Ogunyemi bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịnma ndị nkuzi na mahadum bụ ASUU, kwuru na ụfọdụ nkwa gọọmentị kwere otu ha na-emezughi emezu n'afọ 2009, so n'ihe ha na-ana gọomentị ruo ugbua.

Ọ gwara BBC Igbo na ndị ASUU mahadum ruru iri isii bịara nzukọ ha mere, ebe ha kwekọrịtara na ha ga-esonye n'abụbọ-ọrụ a ma hụ isi ya.

Na mba ofesi,

Amerịka emeela ntuliaka 'mid-term' ha ga-eji họpụta ndị ụlọomeiwu ukwu, nke nta na gọvanọ steeti iri atọ na isii.

Ntuliaka 'mid-term' Amerịka
Nkọwa foto, Ndị mmadụ ebidola ịtụ vootu

Otu nwaafọ Igbo bụ Nnamdi Chukwuocha so na ndị na-azọ ọkwa ọchịchị, ebe ọ na-ele anya ịnọchite anya ndị obodo Delaware.

N'egwuregwu Champions League,

Barcelona na Inter Milan ga-ama onye ike ga-agwụ mgbe ha zutere n'Itali,

Ebe PSG na Napoli, Tottenham na PSV Eindhoven, Atletico Madrid na Borussia Dortmund nakwa Liverpool na Red Star Belgrade ga-akụkọtakwa mpi.

Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri:

Aha onyonyo, ndị ishi na-agụ egwu