Nwata akwụkwọ akwụọla ụdọ na mahadum Nsugbe

Ebe foto si, Getty Images
Mgbe e biputara ya
Nwata akwụkwọ akpọrọ Phillips Chinedu dị afọ iri abụọ na itoolu akwọola ụdọ na Mahadum ndị nkuzi bụ "College of Education Nsugbe."
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Haruna Mohammed kwuru na enyi nwoke Chinedu bụ Obinna Joseph were ha mkpesa na ọ hụrụ ozu Chinedu ka ọ kwụrụ ụdọ n'ime ulọ ya.
Mgbe ndị uwe oji nwetara ozi a, ha gara ebe ihe a mere ma buru ozu Chinedu gawa ụlọ ogwu ebe dọkita kwuru na ọ nwụọla.
E bugara ozu ya n'ụlọ ebe a na-echekwa ozu ebe a ga-eme nyocha ihe mere ya.
Ndị uweojii kwuru na ha ka na-enyocha ya bụ ihe mberede ka ha wee chọpụta ebe ya bụ mmiir sị banye opi ụgbụghịrị.
Akụkọ ndị ga-amsị gị:

























