Buhari ezigala ndị agha 1000 na Zamfara steeti

Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Gọọmentị Naịjirịa ezigala ndị agha dị otu puku na mpaghara ugwu Zamfara steeti iji gboo nsogbu nchekwa gbara obodo ahụ gburugburu.

Ndị ọrụ nchekwa a gụnyere ndị agha ala, ụgbọelu, ndị uweojii nakwa ndị ọrụ nchekwa 'Civil defence' ga-ejikọta aka ọnụ buso ndị a na-eyi ndụ egwu agha.

Ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Garba Shehu gwara BBC na ndị agha ụgbọelu nọ n'ụzọ Katsina ugbua bụ ebe ọdọụgbọelu dị Zamfara steeti nso nọ.

O kwuru na ndị agha ụgbọelu a ga-eji igwe 'satellite' dị n'elu chọpụta njem ndị a na-eyi ndụ egwu na-eme na mpaghara ahụ.

Shehu kwuru na ọ maghị oge ọrụ ole ndị nchekwa a ga-anọ na Zamfara steeti mana nke a bụ ugboro abụọ a na-eziga ndị agha dị ọnụọgụgụ ukwu na mpaghara ahụ.

Maap na-egosi Zamfara steeti

Gọọmentị Zamfara steeti kwuru n'ime mwakpo ahụ, ihe ruru obodo iri na asatọ alaala n'iyi, ihe ruru mmadụ puku iri na asatọ agbafuola n'ebe obibi ha ebe e gburu ihe karịrị mmadụ otu narị.

Ndị a na-awakpo obodo, gbaa ụlọọkụ ma tọọrọ ndị mmadụ n'ihi ego.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ