2019: Buhari ajụla ibinye aka n'iwu ntuliaka

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa bụ onye ikpeazụ ga-ebinye aka n'akwụkwọ maka ịhazigharị ụsoro ntụliaka ndọrọndọrọ ọchịchị ụgbụa
Mgbe e biputara ya

Onyeisiala Naịjira bụ Muhammadu Buhari degara ndị ụlọ omeeiwu sineti akwụkwọ taa na ya agaghị ebinyeli aka n'akwụkwọ iwu ndegharị enwere gbasara ntuliaka nke afọ 2019.

N'akwụkwọ ahụ a gụrụ n'ụlọ sineti taa, Buhari kọwapụtara mkpa ọ dị na o binyeghi aka n'akwụkwọ ahụ, o kwuru na ọ ga-emegide ikike ndị Independent National Electoral Commision (INEC) bụ ndị na-ekpokoba ntuliaka na Naịjirịa.

Nke a bụ dịka akwụkwọ iwu Naịjirịa si kwuo na sektshon 15(A).

N'akwụkwọ ahụ, Buhari kwuru na mmezi e mere na sekshon 138 nke akwụkwọ iwu ntuliaka mere maka iwepụ ohere dị mkpa nke pụtara na e nwere ike ịgbagharị ntuliaka emere ga-eme ka ndị na-azọ ọchịchị ghara inwe ohere inweta ntuliaka dị tọrọ atọ.

O gosipụtakwara ebe ọzọ o nwere nsogbu bụ n'akụkụ 152 na 325 bụ ebe o kwuru na ọ na-agbajọ ikike ụlọ omee iwu ime iwu maka ndị okpuruochịchị ime obodo.

Cheta na ndị sineti nọ ụbọchị Feburuwarị 14, hazie ndegharị edegharịrị ka ọkwa onyeisiala bụrụ ọkwa ikpeazụ a ga-eme ntuliaka ya na Naịjirịa ebe a ga-ebuụzọ mee nke ndị ụlọ omeeiwu, nke ndị gọvanọ esote ya.

Mana e mee nke a, ọ pụtara na ndị ga-azọ ọkwa onyeisiala ga-achịpụ ya na 2019.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ