Ụlọọrụ onyeisi ọrụ mba UK dị na 10 Downing street, arịọla Ezenwaanyị mba ahụ mgbaghara maka oringo ha gbara

Boris Johnson

Ebe foto si, EPA

Mgbe e biputara ya

Ndị ọrụ na 10 Downing street arịọla mgbaghara n'aka Ezenwaanyị Briten maka oringo mbọmchi ha gbara n'ọnwa April afọ gara aga.

Ọnụ na-ekwuru onyeisiọrụ mba sị na "anyị kwara ngaramara maka ya bụ agwa anyị kpara ịme oriri mgbe mba a bụ anyammiri n'anya maka ọnwụ Prince Phillip".

Onyeisi gọọmentị ahụ bụ Boris Johnson esoghị na ya bụ oringo mbọmchi mana ihe e ji ata ya ụta bụ maka ịhapụ ya bụ ihe ka ọ mee mgbe a nọ ọnọdụ nnọpụche maka coronavirus.

Ya bụ awantilo ha gbara abalị abụọ na obi gọọmentị so na ihe kọmitii Sue Gray nọ n'isi ya na-etinye anya na ya.

Ka onyeisi ọrụ gọọmentị mba ahụ bụ Boris Johnson rịọchara mgbaghara, Sir Keir Starmer bụ onyeisi ndị Labour Party sị " nke a egosila ka Boris Johnson si kpụọ ugwu oche ọchịchị Prime Minister n'ala".

"Ndị Pati Conservatives akpụọla ugwu ndị Briten n'ala, ịrịọ mgbaghara abụghị naani ihe ga-egbo ya.

Boris Johnson kwesiri ịkwanyere ya onwe ya ugwu tinye akwụkwọ arụkwaghị m".

O doro anya na ya bụ arịrịọ bụ ndị ọrụ gọọmentị rịọrọ ya.

Ihe kacha kpalite ya bụ okwụ bụ foto ndị patị anọghị n'ọchịchị sere ebe Ezenwaanyị na-eru ụjụ naanị ya maka ọnwụ Duke nke Edinburgh maka nnọpụiche coronavirus ebe ndị isi ọrụ ya na-agba oringo.

Ndị pati dịka Labour pati, Liberal Democrats nakwa SNP na-akpọ oku ka Boris Johnson rituo n'ọchịchị maka agwa a mgbe ọ kwetachara na ya gara ya bụ mmeme.