Stanley Okoro, onye ihe ejije a ma ama alaala mmụọ

Stanley Okoro
Mgbe e biputara ya

Igwe mmadụ si mpaghara Naijiria dị iche iche, ọkachasị ndị na-eme ejije tụrụ n'Amabriba dị n'Ananri, Enugwu Steeti, n'ngwụrụ Stanley Okoro n'abali Ọnwa Ọgọstụ, afọ 2021.

Okoro, onye e ji 'Ibu Junior' mara nwụrụ n'abalị 11 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2021 ka ọ gbachara afọ 29, dịka ọ rịachara ọrịa nwa oge.

Igbe ozu Stanley Okoro
Nkọwa foto, E mere mmmemme olili Ozu Stanley Okoro na ngwuru nna ya dị na n'Amabriba, Okpuru Ọchịchị Ananri,Enugwu Steeti

Tupu ụbọchi olili ya, a mụrụ Okoro anya abali n'Owere, Imo steeti, bụ ebe o bi were na-eme ihe ejije.

Nwanne Stanley Okoro
Nkọwa foto, Nwanne Stanley Okoro
Chigozie Okafor na ndí ejije ndí ózó
Maleek Milton na Destiny Etiko na ndí ózó
Ndị ihe ejije
Jonas Izuagba na ndị ihe ejije

Stanley Okoro, onye ihe ejije a ma ama alaala mụọ

Stanley Okoro

Anyammiri na arịrị ejuola ọtụtụ ndị na-eme ejijje na ndị ihe ha na-amasị ọnụ dịka ọ pụtara ihe na Stanley Okoro, onye ihe ejije Nollywood a ma ama alaala mụọ ka ọ gbachara afọ 29.

Dịka otu enyi ya ma bụrụkwa onye nchịkọta otu jikọrọ ndị na-eme ihe ejije a kpọrọ 'Actors Guild of Nigeria', ngalaba nke Ọlụ, bụ Holy Chidi Okorie, siri gwa BBC Igbo, Okoro nwụrụ ụnyahụ bụ Wenezde, abalị 11 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2021 ka ọ rịachara ọrịa obere oge.

Stanley Okoro

Okorie sịrị, "Nwanne ụnyahụ ka o kwuru na obi na-atachị ya, (breathlessness), ọ naghị ejelikwa ije n'ihi na ụkwụ ya zara aza."

"E bugara ya ebe a na-agwọ ya. Ụtụtụ ụnyaahu (11/08/2021), o bilie gagharịcha, mana oge mgbede, ozi bịara na ọ nwụọla."

Ọnwụ Okoro na-abịa abalị ole na ole onye ejije Nollywood ọzọ bụ Rich Oganiru nwụchara ka ọ rịachara ọrịa ogologo oge.

Stanley Okoro

Ihe ndị ịmaghị maka Stanley Okoro:

  • Okoro bụ onye Enugwu steeti
  • Ọ gbara afọ 29 tupu ọ nwụọ n'abalị 11 nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 2021
  • Ọtụtụ ihe ndị mmadụ ji mara onye ọkpaọchị a bụ 'Stanley Rabbi', ebe ụfọdụ ji 'Ibu Junior' mara ya.
  • O sonyela n'ọtụtụ ihe onyonyo gụnyere "Marrige War", bụ ebe o mere agwa 'osinri'.
  • Ejije ndị ọzọ o soro bụ; "The Pocket Book" "50 Cent", the "Tailor" "Behind the Mask", "The Dark Knight"na ndị ọzọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: