Gọọmenti Naịjirịa ọ chọrọ ịkwụsị nkewa dị n'etiti JSS na SSS n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị?
Gọọmenti Naịjirịa ekwupụtala atụmatụ ịkwụsị nkewa n'etiti ogogo sekọndịrị nke nta na nke ukwu a kpọrọ JSS na SSS n'ịchafụ Bekee.
Minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ bụ Tunji Alausa kwuru na nke a bụ otu n'ime mbọ gọọmenti na-agba iji kwalite ọnụọgụ ụmụakwụkwọ ma belata ogogo dị elu ụmụakwụkwọ ji agbapụ n'ụlọakwụkwọ tupu ha agụchaa sekọndịrị.
Alausa kwuru na ozi ndị ha ji n'aka gosiri na ihe karịrị ụmụaka nde iri abụọ agbahapụla agụmaakwụkwọ ha tupu ha abanye n'ogogo sekọndịrị nke ukwu.
Ọ sịrị na e nwere ụlọakwụkwọ praịmarị karịrị puku iri asatọ na Naịjirịa ugbua, mana ụlọakwụkwọ sekọndịrị nke nta dị naanị ihe dịka puku iri na ise.
Ọ na-abụ nwataakwụkwọ gụchaa sekọndịrị nke atọ bụ JSS 3, o dee ule maka inweta ohere o ji abanye na sekọdịrị nke ukwu, mana ugbua, a na-atụ anya na atụmatụ a ga-eme ka nke ahụ kwụsị.
Cheta na e kere agụmakwụkwọ Naịjirịa ụzọ atọ n'oge ọchịchị mba Briten site n'usoro agụmaakwụkwọ 6-5-4. Nke a pụtara afọ isii na praịmarị, afọ ise na sekọndịrị nakwa afọ anọ n'ụlọakwụkwọ dị elu.
Mana, na ngwụcha afọ ndị 1980, ka Naịjirịa malitere usoro agụamaakwụkwọ 6-3-3-4.
E kewara agụmaakwụkwọ sekọndịrị ụzọ abụọ site n'ịnabata afọ atọ na sekọndịrị nke nta na afọ atọ na sekọndịrị nke ukwu.
Ọ bụ usoro agụmaakwụkwọ a ka Naịjirịa ji eme ihe ruo taa.
Ka ọ dị, anyị ka na-atụ anya inwetakwu ozi gbasara atụmatụ ọhụrụ a. Gaa n'ihu sonyere anyị maka inweta akụkọ ya n'uju.



