Ihere anaghị eme m n'ọrụaka m bụ imezi 'windscreen' ụgbọala - Chiamaka Ifeanyi
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
- Mgbe e biputara ya
Nwaada Chiamaka Ifeanyi bụ nwaagbọghọ na-emezi enyo ihu ụgbọala bụ 'windscreen' n'asụsụ Bekee, ma bụrụkwa nwataakwụkwọ na-agụ 'Nursing Science' na mahadum Calabar.
Oge ya na BBC News Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche, Chiamaka Ifeanyi kọwara na ya mụtara idozi enyo ihu ụgbọala site n'aka nna ya oge ọ nọ na klaasị SS1.
"Mgbe nna m na-akpọ m apụta n'ime ahịa, ka ọ na-arụ ọrụ ka ọ na-asị m "i jide ihe e ji achabi ya, i mee ya etu a", etu ahụ ka m si bido, rue mgbe m mụtara etu e si achabi ma na-etinye ya n'ụgbọala".
"Mgbe ahụ ana m ebe akwa ka m soro nna m bịa ọrụ, oge ụfọdụ m na-esi n'ụlọakwụkwọ, jụọ ya ma ọ nọ n'ahịa, m si n'ụlọakwụkwọ bịa, oge ụfọdụ ana m etinye uwe m ji anọ n'ụlọ n'ime akpa akwụkwọ ka m nweeike si ebe ahụ soro nna m gaa ọrụ ma ụlọakwụkwọ gbasaa," ka Chiamaka kọwara.
Nwaagbọghọ a kọwara na ya amụtala etu e si achabi enyo nke ihu, enyo nke azụ nakwa nke akụkụ.
Nwaada Chiamaka Ifeanyi kwukwara gbasara ụfọdụ ihe ịmaaka ndị ọ na-agabiga dịka nwagbọghọ na-edozi enyo ihu ụgbọala.
Ọ sịrị: "Ihe ịmaka ndị nọ n'ọrụ a bụ ndị mmadụ bịa ha na-ajụ m " ọ bụ na e nweghi ọrụ ọzọ ị maara ị ga-arụ? Ihe a ọ bụ ọrụ ụmụnwaanyị? Ihe ndị a ọ gaghị achakasị gị ahụ, ị maghị na i too ị ga-alụ di, ị ga-ebu ọnya n'ahụ lụọ di"?
"O nwere nke ọ na-abụ onye ahụ a sị gị kpọọ nna gị mana ọ maghị na ị maara ọrụ ahụ ọfụma, na ụdịrị ihe ndị ahụ".
"Emerụọla m ahụ ọtụtụ ugboro n'ebe dị iche iche ma n'ụkwụ m, ọ ka-adị ebe a. Etu m si echekwa onwe m bụ iyi ihe e ji ekpuchi aka na ihe e ji ekpuchi ahụ."
Chiamaka Ifeanyi kwuru na ihere anaghị eme ya n'ọrụ idozi enyo ihu ụgbọala ma kwuo na ọrụ ahụ enweghi okike, kama ihe kachasị mkpa bụ mmadụ itinye uche n'ihe ha ga-emenwu.



