Ihe Gọvanọ Nwifuru kwuru maka ọnwụ Bishọpụ Ụka Katọlik n'Abakaliki

Ebe foto si, Francis Nwifuru/Facebook
Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Francis Nwifuru ekwuputala oke mwute ya n'ọnwụ Bishọp dayọsis ụka Katọlik n'Abakaliki, bụ Rev Peter Nworie Chukwu, onye nwụrụ n'ụbọchị Fraịde 10 Eprel, afọ 2026, dịka ọ gbachara afọ iri isii (60).
N'ozi gọọmenti wepụtara, nke onyeisi mgbasaozi ya bụ Monday Uzor bịnyere aka na ya, Gọvanọ Nwifuru kọwara Bishọpụ Chukwu dịka nnukwu onye ndu ime mmụọ a na-asọpụrụ nke ukwuu. O kwuru na ndụ Bishọpụ ahụ gosipụtara obi umeala, nakwa ikwụsi ike n'ozi Chineke.
Gọvanọ Nwifuru gara n'ihu kọwaa Bishọpụ Chukwu bụ nwaafọ obodo Ededeagu Umuezeokohu dị n'okpuru ọchịchị Ezza Nọt, dịka onye ozi Chineke nwere okwukwe na Chineke.
O kwuru na Bịshọpụ Chukwu bụ onye kwenyere n'udo na ịdịnootu ma nwee ịhụnanya nye mmadụ niile.
Gọvanọ Nwifuru zigara ozi iti aka n'obi nye ezinaụlọ Bishọpụ Chukwu, ndị Ụka Katọlik n'Abakaliki nakwa Ebonyi Steeti niile maka ọnwụ nnukwu onyeozi Chineke a.
Bishọpụ Ụka Katọlik n'Abakaliki, bụ Ụkọchukwu Peter Nworie Chukwu anwụọla

Ebe foto si, Catholic Diocese of Abakaliki
Ụka Katọlik nke Abakaliki ekwupụtala ọnwụ Bishọpụ ha bu Rev. Peter Nworie Chukwu, onye nwụrụ n'ụbọchị Fraịde 10 Eprel, 2026 dịka ọ gbachara afọ 60.
Akwụkwọ ozi dayọsis ụka Katọlik nke Abakaliki wepụtara, bụ nke Vicar ha bụ Fada Donatus Oluwa Chukwu binyere aka na ya, kwuru na ọnwụ Bịshọpụ ha dị oke mwute
Sinetọ na-anọchteanya Ebonyi Nọt n'Ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa bụ Sịnetọ Onyekachi Nwebonyi, kọwara na ọnwụ Bishọpụ Chukwu bụ nnukwu ihe mgbawa obi nye ya, ezinaụlọ ya, ndị Ebonyi Nọt nakwa ndị Ebonyi Steeti niile.
Cheta na Bishọpụ Nworie Chukwu nọrọ na Julaị 2025, mee emume ncheta afọ iri atọ ya dịka Ụkọchukwu.
Kemgbe e chiri ya Ụkọchukwu n'afọ 1993, Bishọpụ Chukwu bụ onye ọtụtụ kọwara dịka Ụkọchukwu nwere obi umeala ma bụrụkwa onye nwere ịhụnanya n'ebe mmadụ ibe ya nọ ma nwee okwukwe na Chineke.
Ụfọdụ ihe i kwesịrị ịma gbasara Bịshọpụ Nworie Chukwu
- A mụrụ Bishọpụ Chukwu n'abalị ise nke ọnwa Nọvemba, n'afọ 1965, n'obodo Ededeagu Umuezeokohu dị n'Ebonyi Steeti.
- O si n'ezinụlọ Katọlik siri ike n'okwukwe bụ ndị gbara mbọ zụlite ya n'ụzọ Chineke. Mgbe ọ na-eto n'obodo ya, onye ọ bụla mara ya dịka obi umeala, nwekwa oké mmasị n'agụmakwụkwọ.
- Ọ rụrụ ọrụ nke ọma n'ụlọakwụkwọ, gbasie mbọ ike n'ihe gbasara ụka, na-eje ozi dịka nwa isi nchụaja ma na-amụ katekizim nke ọma.
- Echiri ya ụkọchụkwụ n'abalị atọ nke ọnwa Julaị, afọ 1993, o rigooro n'ọkwa dị iche iche n'ọrụ ụkọchụkwụ nakwa n'agụmakwụkwọ, tupu Pope Francis echie ya Bishọp n'abalị isii nke ọnwa Julaị, afọ 2021.
- E doro ya nsọ n'abalị iri na itoolu nke ọnwa Ọgọst, afọ 2021, nke mere ka ọ bụrụ Bishọpụ nke atọ na dayọsis Abakaliki.
- Ọ nọchiri anya Bishọpụ Michael Nnachi Okoro, onye chịrị tupu ọ bata, nakwa Bishọpụ Thomas McGettrick, onye bụ Bishọp mbụ na dayọsis ahụ.
- N'oge ọchịchị ya dịka bishọp, a maara Bishọpụ Chukwu maka obi umeala ya, ikpe ịkpe nkwụmọtọ, na nlekọta ndị katolik nọ n'opuru ya.
- O jiri ọkwa ọchịchị ya bụ "Totus tuus ego sum" (nke pụtara "Abụ m nke Gị kpamkpam") duzie ndị kwere ekwe n'ụzọ Chineke.
- Ọchịchị ya mere ka ịdịnootu na okwukwe gbasaa n'ime Ebonyi Steeti niile.
- Most Rev. Dr. Peter Nworie Chukwu nwụrụ n'abalị iri nke ọnwa Eprel, afọ 2026, mgbe ọ gbachara afọ iri isii.



























