Ngagharịiwe Xenophobia: Etu e si kpọlata mmadụ 260 ọzọ si Saụt Afrịka

Ebe foto si, NIDCOM/X
Dịka ngagharịiwe megide ndị mbịarambịara si Afrịka nọ na Saụt Afrịka na-aga n'ihu, ihe karịrị ụmụ Naịjirịa mmadụ 260 esila na mba Saụt Afrịka wuchie Legọs n'ụtụtụ Fraịde dịka Gọọmenti Etiti kpọlatara ndị ọhụrụ.
Nke a na-eweta ọnụọgụgụ ndị gọọmentị si Saụt Afrịka kpọlata ka ha ruo ihe karịrị mmadụ 700.
Ọnụ na-ekwuru Mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na ndị mba ọzọ bụ Kimiebi Imomotimi Ebienfa, gwara BBC na mmadụ 266 wuchiri na Legọs n'ebe elekere 10:40 nke ụtụtụ.
Naịjirịa malitere ibubata ụmụafọ ha bi mba ahụ dịka ngagharịiwe megide ndị mbịarambịara ejighị akwụkwọ, nke mere ka ụfọdụ ụmụ Naịjirịa rịọwa enyemaka gọọmentị iji si ebe ahụ lọta n'ihi egwu maka ndụ ha.
Nke abụ ndị nke anọ a na-ebulata dịka ndị ọrụ gọọmentị na-ekwu na ọ ka nwere ndị a ga-ebulata ndị ọzọ na abalị isii nakwa abalị Itoolu nke ọnwa Julaị, afọ 2026.
Gọọmentị agwala ụmụamala na-alọta ka ha dekọ ihe ndị ha nere ebe ahụ sị na e mecha gọọmentị Naijria ga-achọ ka Gọọmentị Saụt Afrika kwụọ ha ihe iti aka n'obi.
























