Ndị omekome agbagbuola ọkaikpe n'ime ụlọikpe

Nnaemeka Ugboma

Ebe foto si, Emperor Iwuala

Mgbe e biputara ya

Ndị omekome egbuola otu ọkaikpe aha ya bụ Nnaemeka Ugboma bụ onyeisi ụlọikpe nta dị n'Ejemekwuru n'okpuruọchịchị Oguta dị n'Imo steeti.

Akụkọ kwuru na egburu ya mgbe ọ nọ n'oche na-ekpe ikpe n'ime ebe ahụ nke mere ka ndị mmadụ gbakọrọ n'ebe ahụ gbapụ ọsọ ndụ.

Ndị hụ ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC na ndị ahụ mere nke a bu ọgbatumtum bịa n'ụlọikpe ahụ.

"Ha baara n'ime ụlọikpe dọpụta ya n'ilo, gbagbuo ya ma si ebe ahụ pụọ" ka ọ kọọrọ anyị.

O kwukwara na ndị mmadụ ji egwu gbahapụ ozu nwoke ahụ dịka ha na-agba ọsọ ndụ iji zọ onwe ha.

Nnaemeka Ugbomma

Ebe foto si, Emperor Iwuala

Onyeisioche otu jikọrọ ndị ọkaiwu na steeti ahụ bụ Ugochukwu Allinor kwuru na ọ bụ n'ezie na egburu ọkaikpe ahụ.

O kwukwara na agba otu ha nke dị n'Owere na-etikota isi ọnụ ịma ihe ha ga-eme maka ọdachi a ma zikwaa ọha mmadụ ozi mgbe oge ruru.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Henry Okoye azaghị ekwentị ya maọbụ zaa ozi e zigaara ya maka ihe a mere.