Sierra Leone Election Result: Nchịkọta mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala mba ahụ

Julius Bio Maada meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala Sierra Leone nke afọ 2023.

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya

Mba Sierra leone mere ntuliaka ọkwa onyeisiala ha n'ụbọchị Satọde Juun 24, 2023.

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na mba ha bụ 'Electoral Commission of Sierra Leone' kpọpụtara na aha onyeisiala ha bụ Julius Maada Bio nke 'Sierra Leone Peoples Party (SLPP) dịka onye meriri.

O nwereike igwe gị agaghị ewepụta ụfọdụ ihe ngosi ndị a

Bio nwetara vootu 1,566,932, nke bụ pasentị 56 na ụma nke vootu niile a tụrụ na ntuliaka ahụ.

Ebe onye na-eso bụ Samura Kamara nke 'All Peoples Congress' (APC) nwetara vootu 1,148,262, bụ pasentị 41 na ụma nke vootu niile a tụrụ.

O nwereike igwe gị agaghị ewepụta ụfọdụ ihe ngosi ndị a