Oxlade Video Tape: Ụfọdụ ndị a ma ama ihe onyonyo aramara ha gbarala n'anwụ

Oxlade, Tiwa, Shatta na Tacha
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Okwu a kpụ n'ọnụ ugbua bụ etu ihe onyonyo aramara oti egwu bụ Ikuforji Olaitan e ji 'Oxlade' mara si gbaa n'anwụ.

Nke a mere ndị mmadụ ji kpụrụ nwa amadị a n'ọnụ dịka ọtụtụ na-eto ya, ebe ndị ọzọ na-akatọ ya.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụ gịnị mere e ji na-eto nwamadị a mana katọọ Tiwa Savage oge ihe onyonyo nke ya pụtara na soshal midia n'oge gara aga.

A matabeghi onye gbara ihe onyonyo a n'anwụ ebe nwamadị a bụ Oxlade ekwubeghi pịm banyere ya.

Onye bụ Oxlade?

Ikuforji Olaitan mana 'Oxlade' bụ e ji maara ya n'iti egwu ya.

Ezi aha nwamadị a bụ Ikuforji Olaitan mana 'Oxlade' bụ e ji maara ya n'iti egwu ya.

Ọ na-eti egwu bụ nke ọ sị na ọ malitere n'ụlọụka mgbe ọ dị obere.

Ọ sị na nne na nna ya nwụrụ mgbe ọ dị obere na ọ bụ nnenne na nnanna ya zụlitere ya.

Oxlade gbapụtara ihe n'afọ 2020 mgbe o tichara egwu ọ kpọrọ "Away" bụ egwu mere ọfụma n'afọ ahụ.

O tiela egwu ndị ọzọ dị iche iche gụnyere Oxygen, Ojuju dgz.

Nke a abụghị mbụ ihe onyonyo aramara ndị a ma ama na-agba n'anwụ ma wuwe na soshal midia.

Ndị ọzọ nke ha gbarala n'anwụ gụnyere:

Tiwa Savage

Tiwa Savage

N'ụbọchị 8 nke ọnwa Ọktoba afọ 2021, Tiwa Savage na mkparịtaụka o nwere na New York sị na mmadụ chọrọ iji ihe onyonyo aramara ya atụnarị ya ego.

Tiwa sị na ọ bụ aramara mere n'etiti ya na ọyị ya nwoke mana ọ maghị ka o si ruo onye ahụ aka.

Ihe onyonyo ahụ mechara gbaa n'anwụ nke mere ọtụtụ ji kpụrụ ya n'ọnụ.

Tacha

Tacha

Tacha bụ onye a ma ama so n'emume Big Brother Naija nwetere ozi n'afọ 2020 banyere foto ebe ọ gba ọtọ.

Mana Tacha sị na nke ahụ bụ foto a rụrụ arụ na ọ bụghị nke ya n'ezie.

Salawa Abeni

Salawa Abeni

N'ọnwa Eprelụ afọ 2020, oti egwu bụ Salawa Abeni kwuru na mmadụ chọrọ iji foto ebe ọ gba ọtọ anapụ ya ego.

N'ozi o wepụtara n'Instagram Abeni sị na ọ dị ka ọ bụ mgbe ọ nọ n'ụlọọgwụ maọbụ mgbe ya na onye nke ya nọ ka e sere foto ahụ.

O mechara were aka ya gbaa foto ahụ n'anwụ ma sị na mmadụ agaghị e ji ya mekpaa ya ahụ.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Small Doctor

Small Doctor

N'afọ 2017, ihe onyonyo ebe oti egwu a kpọrọ Small Doctor na-emetụ onwe ya aka n'amụ n'akara Snapchat.

Akụkọ sị na o mechara wepu ya ma sị na ọ mmadụ zobara n'ime ekwentị ya ma wepụta onyonyo ahụ.

Shatta Wale

Shatta Wale

N'afọ 2018, ihe onyonyo pụtara na snapchat nwafọ Gana bụ Shatta Wale gosiri ka nwaanyị ji ọnụ na-amị amụ ya.

O mechara tinye ya na snapchat ma jụọ " ọ bụ na ndị mmadụ ahụtụbeghi ya mbụ?"

Mana o kwughi ma ọ bụ ya ka nwaanyị na-amị amụ n'ezie.