Oxfam Report: Ihe karịrị mmadụ nde 94 ahụghị tụtụrụ rachaa na Naịjria

Crowd

Ebe foto si, European Photopress Agency

Mgbe e biputara ya

Ụlọọrụ bụ nke anọghị n'okpuru gọọmentị bụ Oxfam International sị na ihe dịka 94,470,535 bụ ogbenye ọnụntụ na Naijirịa.

Nke pụtara na ndị a anaghị enweta ego ruru narị naịra isii na iri asatọ na anọ (N684.00) kwa ụbọchị.

Onyeisi ndị Ọxfam bụ Constant Tchona kwuru nke a ụbọchị Monday n'Abuja na-ọgbakọ ha ji tinye anya ka ọrụ ha sị gaa ha kpọrọ "On the Road To Becoming an Influencing Hub".

Tchona kwuru na ọnụọgụ a dịbụ 91,501,377 n'ọnwa Apreelụ bụ nke mere eji ahụta Naịjirịa ka isi obodo ndị ụbịam dara.

Ọ dị ka nke ahụ ezughị, ya bụ ọgụ nwere 2,969,158 rigo ọzọ n'ọnwa a bụ nke mezuru ya 94,470,535 ọ dị ugbua.

oxfam

Ebe foto si, Press Association

Tchona sị na ọnụọgụ a akarịrị ọnụọgụ mba ụfọdị n'Afrịka dịka Gambia na Cape Verde.

Ọ sị na nke a pụtara na Naijirịa anọghị nso na mmezu Sustainable Development Goals (SDGs) bụ nkwa ndị mba ụwa kwere maka ihe aga eme ka ụwa dị mma.

Dịka "Worldometer " si dee, ọnụọgụ Naịjirịa ugbua dị 200,963,599 nke ga-eme ka ha bụrụ mba kacha n'ụba mmadụ n'afọ 2050.

Tchona sị na gọomentị Niajirịa ma na ya bu nsogbu chere ha n'ihu.

Akụkọ ga-amasị gị