Ụlọikpe achụpụla osote onyeisi omeiwu Delta steeti

Ebe foto si, Delta state House of Assembly
Mgbe e biputara ya
Ụlọikpe ukwu dị na Kwale, achụpụla Friday Osanebi bụ osote onyeisi omeiwu nke Delta steeti.
Ha kwuru na ha chụpụrụ Osanebi na-anọchite anya ndị Ndokwa East, maka na ọ tụrụ asị banyere onye obodo ọ bụ.
Nchụpụ a na-abịa n'agbanyeghị na ọ nọọla n'ọnọdụ osote onyeisi omeiwu afọ atọ.
Ọkaikpe V. I Ofezi, gwara ndị Inec ka ha were ọsọ were ije napụta asambodo mmeri ha nyere Osanebi.
O kwuru ka ha nye Emeke Odegbe bụ onye otu Pdp ahọpụtara n'ụzọ ziri ezi na ntuliaka 2015 asambodo ahụ.
Osanebi nyere ọkaiwu ya ikike iji gbaghaa ikpe a.
Ọnụ na-ekwuchitere Osanebi bụ Agbanishi Obinne, gwara ndị ntaakụkọ na ụjọ atụla ha, na Osanebi gbadoro anya nakwa na-agba mbọ igbanwe ndụ ndị ọ na-anọchite.

























