Ndị gbara ọsọndụ Kamerunu 'karịrị ụgboro atọ' na Naijirịa

Ebe foto si, AFP
Mgbe e biputara ya
Ndị ọrụ enyemaka na Cross River steeti gwara BBC na ihe dịka mmadụ puku iri atọ na puku atọ si mba Kamerunu bata Naịjirịa.
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ihe mberede na steeti ahụ bụ John Inakuththe kwuru na ọnụ ọgụgụ nke a bụ ezie.
O kwukwara na ọnọdụ ndị ahụ na-emebị kwa ụbọchị na-aga mana ha na-akwado irụrụ ha ebe obibi nke nta.
Ndị ọrụ ebe ahụ na-akwado ibido denyewe aha ndị ahụ gbatara ọsọ na Naịjirịa ka ejiri ya mara ihe a ga-emere ha.
Otu nwoke n'ime ndịa na-agba ọsọndụ gwara BBC na ọ nọrọ izuuka asatọ ebe ọ na-agagharị n'ime ohịa.


























