Roxy Ogechi Ndebumadu nwada Igbo bụ onyeisi okpuruọchịchị Bowie n'Amerịka
Mgbe e biputara ya
Nwada Igbo aha ya bụ Roxy Ogechi Ndebumadu kọọrọ BBC Igbo etu njem ya n'ịzọ ọkwa onyeisi okpuruọchịchị Bowie nke Maryland, mba Amerịka.
Ọ gụrụ akwụkwọ na ngalaba Kọmputa Sayensị tupu ọ banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Nwada a dị afọ 27 ugbua sị na ọ zọrọ ọkwa mgbe ọ dị afọ 26 ma merie n'agbanyeghi na mmadụ anọ ọzọ so ya zọọ ọkwa tọchara atọ.
Ndebumadu sị na ihe mere o ji malite ịzọ ọkwa a bụ ka o nyere ndị ọ na-esiri ike aka n'obodo ahụ.
Ọ sị na ọ malitere ịchụ nta vootu naanị otu ọnwa tupu e mee ntuliaka nyere ya mmeri.
Kirie ihe o kwuru n'uju.
Ndị mere akụkọ a bụ Chimamaka Ihenacho na Nnamdi Agbanelo



