Etụ gọọmentị Naịjirịa ga-esi họpụta mmadụ 774,000 ha chọrọ iwe n'ọrụ

Aha onyonyo, Etụ gọọmentị Naịjirịa ga-esi họpụta mmadụ 774,000 ha chọrọ iwe n'ọrụ
Mgbe e biputara ya

Onyeomeiwu bụ Toby Okechukwu akọwala iwe ndị omeiwu nta maka ọrụ gọọmentị etiti chọrọ iwe na atụmatụ "Special Works Programme" (SWP).

Cheta na-agbanyeghi na ndị omeiwu Naịjirịa sị ka ewezuga mkpebi gọọmenti iwe mmadu 774,000 n'ọrụ site na SWP, na minista na-ahụ maka ọrụ bụ Festus Keyamo, bụ onye atụmatụ a dị n'aka sị na ọ ga-aga n'ihu.

Keyamo na ngalaba ụlọomeiwu Naịjirịa na-ahụ maka ọrụ nwere nghọtaghie n'ụbọchị Mọnde dika ha na-eme mkparitaụka banyere atụmatụ a.

Ndị omeiwu sị na Keyamo akwanyereghi ha ugwu dịka nzukọ ahụ na-aga n'ihu, ma mechaa sị ya si ebe ahụ ha nọ pụọ.

Keyamo na onwe ya sị na nke ahụ abụghị eziokwu. Ọ si na ihe na-ese okwu bụ na ya chọrọ ka a kpaa nkata banyere iwe n'ọrụ a n'ihu ndị ntaakụkọ, mana ndị omeiwu chọrọ ka ọ bụrụ na nzuzo.

Dịka ọ kwụ ugbua, ndị omeiwu, site n'ọnụ onyeisi kọmitii ahụ bụ Muhammadu Alli Wudil, sị na iwe n'ọrụ ahụ kwụsịgodu makana obi akaghị ha etu esiri chọọ ime ya.