World Sickle Cell Day: Ihe mere m ji enyere ndị bu ọrịa 'Sickle cell' aka

Aha onyonyo, World Sickle Cell Day: Ihe mere m ji enyere ndị bu ọrịa 'Sickle cell' aka
Mgbe e biputara ya

Maureen Nchekwube bụ otu nwagbọghọ, onye ya na ụmụnne ya abụọ rịara ọrịa 'sickle cell' akọwala ihe ha gabigara nke mere ha ji enyere ndị bu ọrịa a aka ugbua.

Ọ sị na mgbe ọ gara Mahadum ka ọ chọpụtara na ọtụtụ mmadụ amaghị ihe gbasara ọrịa nke ọma, na ọ bụ ebe ahụ ka ọ malitere ikuziri ndị mmadụ ihe banyere ya.

Mgbe ọ gụchara akwụkwọ o kpebiri na o nweghi ihe ọzọ ọ ga-arụ ma ọ bụghị ị na-enyere ndị bu ọrịa 'sickle cell' aka etu ha ga-esi chekwaa ndụ ha.

Nchekwube sị ihe ọzọ ha na-eme bụ ịkwado ụfọdụ n'ime ndị na-enyeghi ego ha ji aga ụlọọgwụ site n'inye ha ọgwụ.

O nyekwara ndụmọdụ sị tupu nwoke na nwaanyị ana-alụ onwe ha gbalịa gaa ụlọọgwụ mee nyocha ahụ a kpọrọ 'Genotype' ka nwee ike gbanarị ọghọm dị n'ịmụta nwata bu ọrịa 'sickle cell'.

Kirie ihe o kwuru n'uju.

Onye mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka

Akụkọ ndị ga-amasị gị: