Chukwuemeka Ezeife: 'Restructuring' ga-aka baara ndị Ọwụwa Anyanwu uru

Aha onyonyo, Chukwuemeka Ezeife sị na ihe kara ndị Igbo mma kitaa bụ 'restructuring'.
Mgbe e biputara ya

Chukwuemeka Ezeife, bụ aka chịburu Anambara steeti n'agbata ọnwa Jenụwarị afọ 1992 rue Novemba afọ 1993.

Dike ahụ gụrụ 'Economics' na mahadum ala Bekee a kpọrọ 'Harvard University' gwara Uche Akolisa nke BBC Igbo na mkparịtaụka n'Abuja, mpụ akarịala na ntuliaka a na-emezi na Naijria nakwa n'ọchịchị obodo.

Ọ rụtụrụ aka n'ihe mere na ntuliaka ọkwa gọvanọ Kogi na Bayelsa steeti enweghị atụ dịka ọ katọrọ ọchịchị oge otu PDP na nke APC.

O kwukwara na ihe kara ndị Igbo mma ugbua bụ nhazigharị na mpaghara na mpaghara nke Bekee kpọrọ 'restructuring'.

Kirie ya n'uju:

Akụkọ ga-amasị gị: