Lee ihe mere n'arụsị Fela ebe Emmanuel macron gara ụnyaahụ

Mgbe e biputara ya

Onyeisiala mba Frans bụ Emmanuel Macron bịara Naịjirịa ụnyaahụ ebe ya na onyeisiala Buhari mere ọgbakọ tupu ọ gawa Legos n'arụsị Fela.

Emmanuel Macron
Nkọwa foto, Obi aṅụrị juru onyeisiala mba Frans afọ n'Afrika Shrine na Legos ebe ya na gọvanọ Legos na ọgụegwu si Ben bụ Angelique Kidjo nọ
Macron na Angelique Kidjo
Nkọwa foto, Onyeisiala mba Frans na-achịsara nwaanyị onye egwu Bene bụ Angelique Kidjo ọchị ebe gọvanọ Legos steeti nọ ha n'akụkụ n'arụsị Fela
Emmanuel Macron n'arụsị Fela
Nkọwa foto, Emmanuel Macron debere aka o ji agba shaku shaku n'akụkụ ndị ọzọ nọ ya nso
Emmanuel macron na onye sere ya
Nkọwa foto, Emmanuel Macron zutere nwantakịrị nwoke sere ya oge ọ gara arụsị Fela
Emmanuel Macron na nwantakịrị sere ya
Nkọwa foto, Emmanuel Macron zutere nwantakịrị nwoke sere ya oge ọ gara arụsị Fela
Femi Anikulapo Kuti
Nkọwa foto, Nwa Fela na-eme ihe ọ mara eme na nkwu arụsị nna ya bụ Fela
Emmanuel macron na arụsị Fela na Legos
Nkọwa foto, Emmanuel Macron n'akụkụ gọvanọ Legos bụ Akinwunmi Ambode
Femi Kuti
Nkọwa foto, Femi Kuti ji opi ya egosipụta nke ọ na-eme nke ọma nye onyeisiala mba Frans
Emmanuel macron na arụsị Fela na Legos
Nkọwa foto, Femi Kuti na-ezi Emmanuel Macron ozi nna ya n'arụsị Fela
Emmanuel macron n'arụsị Fela na Legos
Nkọwa foto, Onye egwu Bene bụ Angelique Kidjo na Femi Kuti nakwa onye egwu mba Senegal bụ Youssou N'dour na-enye Emmanuel Macron ezi ihe nkiri na Fela's Shrine na Legos
Emmanuel Macron na Femi Kuti na ọgụegwu Senegal Youssou N'dour n'African Shrine na Legos
Nkọwa foto, Emmanuel Macron na Femi Kuti na ọgụegwu Senegal Youssou N'dour sere foto n'Afrika Shrine na Legos
Emmanuel macron na arụsị Fela na Legos
Nkọwa foto, Mmadụ niile chọrọ iso Emmanuel macron see 'selfie' n'arụsị Fela
Emmanuel macron na arụsị Fela na Legos
Nkọwa foto, Femi Kuti sokwa chọọ iso Emmanuel macron see 'selfie'
Emmanuel Macron na Abderahmane Sissako
Nkọwa foto, Emmanuel Macron na onye na-eme ihe onyonyo na mna Mọritenia bụ Abderahmane Sissako na Afrika Shrine
Ndị egwu
Nkọwa foto, Ndị egwu nabatara onyeisiala mba Frans bụ Emmanuel macron
Emmanuel Macron
Nkọwa foto, Onyeisiala mba Frans gara Afrika Shrine ụlọ onye otiegwu a ma ama na Naịjirịa lara mmụọ bụ Fela Anikulapo Kuti